Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Mak 14:43-47
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 43 Ozugbo ahụ, mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas, otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, bịarutere, ya na ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na okpiri. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye dunyere ha.+ 44 Onye ga-arara ya nye nyere ha ihe àmà ha na ya kwekọrịtara. Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya. Jidenụ ya. Kpụrụnụ ya pụọ, unu ekwekwala ka ọ gbafuo.” 45 O wee bịarute n’ebe ọ nọ, sị: “Onye Ozizi.”* O wee jiri nwayọọ susuo ya ọnụ. 46 N’ihi ya, ha jidere ya ma kpụrụ ya. 47 Ma, otu n’ime ndị guzo n’akụkụ mịịrị mma agha ya, gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà, bepụ ya ntị.+

  • Luk 22:47-51
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 47 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ìgwè mmadụ bịara, nwoke ahụ a na-akpọ Judas, bụ́ otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, dukwa ha. O wee bịaruo Jizọs nso ka o susuo ya ọnụ.+ 48 Ma Jizọs sịrị ya: “Judas, ì ji isusu ọnụ arara Nwa nke mmadụ nye?” 49 Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe na-aga ime, ha sịrị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị jiri mma agha lụso ha ọgụ?” 50 Otu onye n’ime ha gbudịrị ohu nnukwu onye nchụàjà mma, bepụ ntị aka nri ya.+ 51 Ma Jizọs sịrị: “O zuolanụ.” O wee bitụ ntị nwoke ahụ aka, gwọọ ya.

  • Jọn 18:3
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 3 Judas wee kpọrọ ìgwè ndị agha na ndị nche bịa n’ebe ahụ. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị Farisii zitere ndị nche a. Ha ji ọwa ọkụ na mpanaka* na ngwá ọgụ bịa.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya