Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Abụ Ọma 22:16-18
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 16 Ndị iro gbara m gburugburu ka nkịta.+

      Ha na-agba m gburugburu ka ìgwè ndị na-eme ihe ọjọọ.+

      Ha na-ata m arụ n’aka nakwa n’ụkwụ ka ọdụm.+

      17 A na-ahụzi ọkpụkpụ m niile anya.*+

      Ndị iro m na-ele m anya. Ha kporopụrụ anya na-ele m.

      18 Ha kere uwe m,

      Ha fekwaara uwe m nza.+

  • Aịzaya 53:1-12
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 53 Ònye nwere okwukwe n’ihe a nụrụ n’ọnụ anyị?*+

      Ònyekwa ka Jehova mere ka ọ mara ike* ya?+

       2 Ọ ga-epulite dị ka ome+ n’ihu ya.* Ọ ga-adịkwa ka mgbọrọgwụ nke dị n’ala mmiri na-adịghị.

      Ọ dịghị ka onye ukwu. Ọ dịghịkwa ebube.+

      Mgbe anyị ga-ahụ ya, anyị agaghị ahụ mma pụrụ iche ọ mara nke ga-eme ka anyị bịawa ya nso.

       3 Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya.+

      Ọ ma gbasara ihe mgbu, marakwa ihe ọrịa bụ.

      Ọ dị ka à ga-asị na e zoro ihu ya ezo ka anyị ghara ịhụ ya.*

      E ledara ya anya. Anyị ejighịkwa ya kpọrọ ihe.+

       4 N’eziokwu, o buuru ọrịa anyị niile,+

      Burukwa ihe na-egbu anyị mgbu.+

      Ma anyị weere ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o mesiri ike, na onye o mekpara ahụ́.

       5 A mara ya ube+ n’ihi mmehie anyị.+

      E chiri ya ọnụ n’ala n’ihi ihe anyị mejọrọ.+

      Ahụhụ a tara ya mere ka anyị nwee udo.+

      Ahụ́ e merụrụ ya mekwara ka a gwọọ anyị.+

       6 Anyị niile akpafuola ka atụrụ.+

      Onye ọ bụla n’ime anyị gawara n’ụzọ nke ya.

      Ma, Jehova emeela ka onye ahụ buru mmehie anyị niile.+

       7 E mesiri onye ahụ ike.+ O kwere ka e mekpaa ya ahụ́.+

      O kwughịkwa ihe ọ bụla.

      A kpụụrụ ya ka atụrụ a gaje igbu egbu.+

      Ọ dị ka nne atụrụ gbara nkịtị ka a na-akpacha ya ajị.

      O kwughịkwa ihe ọ bụla.+

       8 A kpụụrụ ya pụọ mgbe e kpechara ya ikpe mkpegbu.

      Ònyekwa ga-echegbu onwe ya banyere ihe niile gbasara ezinụlọ o si?*

      N’ihi na e gburu ya ya agharazie iso ná ndị dị ndụ.+

      E tiri ya ihe* n’ihi na ndị m mere ihe ọjọọ.+

       9 N’agbanyeghị na o meghị ihe ọjọọ ọ bụla,*

      Nakwa na o kwughị ihe ga-eduhie onye ọ bụla,+

      Mgbe ọ nwụrụ, ebe e kenyere ya a ga-eli ya dị ebe nke ndị ajọ omume dị.+

      E likwara ya ebe e liri ndị ọgaranya.*+

      10 Ma, ọ bụ uche* Jehova ka a taa ya ezigbo ahụhụ. O kwekwara ka ọ rịa ọrịa.

      Ọ bụrụ na ị ga-eme ka e jiri ndụ* ya chụọ àjà ikpe ọmụma,+

      Ọ ga-ahụ ụmụ* ya. Ọ ga-adịtekwa ndụ aka.+

      A ga-esi n’aka ya mee ka uche* Jehova mezuo.+

      11 N’ihi ahụhụ niile ọ* tara, ọ ga-ahụ uru ihe o mere bara. Ọ ga-ejukwa ya afọ.

      Ohu m,+ bụ́ onye ezi omume, ga-eji ihe ọ ma

      Mee ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume.+

      Ọ ga-eburukwa mmehie ha.+

      12 N’ihi ya, m ga-ekenye ya na ọtụtụ ndị òkè.

      Ya na ndị dike ga-ekekwa ihe a kwatara n’agha,

      N’ihi na o kwere ka e gbuo* ya.+

      A gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu.+

      O buuru mmehie ọtụtụ ndị,+

      Gbachitekwara ndị na-emebi iwu.+

  • Daniel 9:26
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 26 “Mgbe izu iri isii na abụọ ahụ gachara, a ga-egbu Mezaya,+ ya agbara aka.+

      “Ndị agha nke onyeisi na-abịanụ ga-ebibi obodo ahụ nakwa ebe nsọ ahụ.+ A ga-ebibi ya ka* à ga-asị na ọ bụ idei mmiri bibiri ya. Ma a ga na-alụ agha ruo n’ọgwụgwụ. Ihe e kpebiri bụ mbibi.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya