14 Mgbe Jizọs batara n’ụlọ Pita, ọ hụrụ nne nwunye Pita+ ka o dina ala n’ihi na ahụ́ ọkụ ji ya.+15 O wee bitụ ya aka n’aka,+ ahụ́ ọkụ ahụ akwụsị. Nwaanyị ahụ bilikwara jewere ya ozi.
38 Mgbe o si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ, ọ banyere n’ụlọ Saịmọn. Ma oké ahụ́ ọkụ ji nne nwunye Saịmọn, ha rịọkwara ya ka o nyere ya aka.+39 O wee guzoro ya n’akụkụ mee ka ahụ́ ọkụ ahụ kwụsị. Nwaanyị ahụ biliri ozugbo jewere ha ozi.