Ndị Rom 12:18 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụkwa unu ka ọ dị n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.+ Ndị Efesọs 4:29 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 29 Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta,+ kama, na-ekwunụ naanị okwu dị mma n’oge dabara adaba, nke ga-abara ndị nụrụ ya uru, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike.+ 1 Ndị Tesalonaịka 5:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 Anyị na-arịọkwa unu ka unu jiri ha kpọrọ ihe ma na-ahụ ha n’anya nke ukwuu n’ihi ọrụ ha.+ Unu na ibe unu na-adị n’udo.+ Ndị Hibru 12:14 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 14 Na-agbanụ mbọ ka unu na mmadụ niile na-adị n’udo,+ na-adịkwanụ nsọ+ n’ihi na mmadụ agaghị ahụ Onyenwe anyị ma ọ bụrụ na onye ahụ adịghị nsọ.
29 Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta,+ kama, na-ekwunụ naanị okwu dị mma n’oge dabara adaba, nke ga-abara ndị nụrụ ya uru, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike.+
13 Anyị na-arịọkwa unu ka unu jiri ha kpọrọ ihe ma na-ahụ ha n’anya nke ukwuu n’ihi ọrụ ha.+ Unu na ibe unu na-adị n’udo.+
14 Na-agbanụ mbọ ka unu na mmadụ niile na-adị n’udo,+ na-adịkwanụ nsọ+ n’ihi na mmadụ agaghị ahụ Onyenwe anyị ma ọ bụrụ na onye ahụ adịghị nsọ.