26 O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ.+ Kama onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+27 Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu.+
35 O wee nọdụ ala ma kpọọ ndịozi ya iri na abụọ, sị ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ga-abụ onye ikpeazụ na onye na-ejere mmadụ niile ozi.”+
48 wee sị ha: “Onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị a n’aha m na-anabatakwa m. Onye ọ bụla nke na-anabata m na-anabatakwa onye zitere m.+ N’ihi na onye na-eme onwe ya ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.”+