-
Matiu 20:26-28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ.+ Kama onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ 27 Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu.+ 28 Otú ahụ ka Nwa nke mmadụ mere. Ọ bịaghị ka e jeere ya ozi, kama ọ bịara ka o jee ozi+ ma nye ndụ* ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.”+
-
-
Mak 10:43-45Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
43 O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ. Kama onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ 44 Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu niile. 45 N’ihi na Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ọ bịara ka o jee ozi+ ma nye ndụ* ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.”+
-