Diuterọnọmi 6:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile+ na ike gị niile*+ hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya. 1 Samuel 15:22 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 22 Samuel asị ya: “Àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ hà na-amasị Jehova+ karịa irubere Jehova isi? O doro anya na ọ ka mma irube isi karịa ịchụ àjà,+ ige ntị nke ọma dịkwa mma karịa abụba+ ebule. Hosia 6:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 N’ihi na ihe na-atọ m ụtọ bụ ịhụnanya,* ọ bụghị àjà. Ịmara Chineke na-atọkwa m ụtọ, ọ bụghị àjà a na-esucha ọkụ.+
22 Samuel asị ya: “Àjà a na-esu ọkụ na àjà ndị ọzọ hà na-amasị Jehova+ karịa irubere Jehova isi? O doro anya na ọ ka mma irube isi karịa ịchụ àjà,+ ige ntị nke ọma dịkwa mma karịa abụba+ ebule.
6 N’ihi na ihe na-atọ m ụtọ bụ ịhụnanya,* ọ bụghị àjà. Ịmara Chineke na-atọkwa m ụtọ, ọ bụghị àjà a na-esucha ọkụ.+