-
Matiu 26:6-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Mgbe Jizọs nọ na Betani, n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta,+ 7 otu nwaanyị ji mkpọ̀ alabasta,* nke mmanụ na-esi ísì ọma dị n’ime ya, bịakwute ya. Mmanụ ahụ dịkwa oké ọnụ. Nwaanyị ahụ wee malite ịwụkwasị ya n’isi ya ka ọ nọ na-eri ihe. 8 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, ha were iwe, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a n’iyi? 9 N’ihi na a gaara ereta ya ezigbo ego ma nye ya ndị ogbenye.”
-
-
Jọn 12:2-5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 E wee meere ya oriri anyasị n’ebe ahụ. Mata nọ na-eje ozi.+ Ma Lazarọs so ná ndị ya na ha nọ na-eri ihe. 3 Meri wee were mmanụ na-esi ísì ọma dị otu paụnd* n’arọ tee Jizọs n’ụkwụ ma jiri ntutu isi ya hichaa ya ụkwụ. Mmanụ ahụ bụ ezigbo mmanụ nad,* ọ dịkwa oké ọnụ. Ísì mmanụ ahụ wee ju n’ụlọ ahụ.+ 4 Ma Judas Iskarịọt,+ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, onye na-aga ịrara ya nye, sịrị: 5 “Gịnị mere na e reghị mmanụ a na-esi ísì ọma narị mkpụrụ ego dinarịọs* atọ (300) ma nye ya ndị ogbenye?”
-