3 E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị:
“Dozienụ ụzọ Jehova!+
Sinụ n’ọzara waara Chineke anyị okporo ụzọ kwụ ọtọ.+
4 Meenụ ka ndagwurugwu niile dị elu,
Meekwanụ ka ugwu ukwu niile na ugwu nta niile dị larịị.
Ala dị ndakoro ndakoro ga-adị larịị.
Ala na-adịghị larịị ga-adịkwa larịị.+
5 A ga-eme ka a mara na Jehova dị ebube.+
Mmadụ niile ga-ahụkwa ya,+
N’ihi na Jehova ji ọnụ ya kwuo ya.”