-
Matiu 3:7-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Mgbe ọ hụrụ ọtụtụ n’ime ndị Farisii na ndị Sadusii+ ka ha na-abịa n’ebe ọ nọ na-eme baptizim, ọ sịrị ha: “Unu ụmụ ajụala,+ ònye gwara unu ka unu gbanahụ iwe Chineke na-abịanụ?+ 8 Burunụ ụzọ mịa mkpụrụ na-egosi na unu echegharịala. 9 Unu agwakwala onwe unu, sị, ‘Ebreham bụ nna anyị.’+ N’ihi na ana m asị unu na Chineke nwere ike isi na nkume ndị a mee ka Ebreham nweta ụmụ. 10 E dowelarị anyụike na mgbọrọgwụ osisi. N’ihi ya, a ga-egbutu osisi ọ bụla na-anaghị amị ezigbo mkpụrụ, tụbakwa ya n’ọkụ.+
-