-
Matiu 17:10-12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 Ma, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “Gịnịzi mere ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa?”+ 11 Ọ gwara ha, sị: “N’eziokwu, Ịlaịja na-abịa. Ọ ga-emekwa ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ.+ 12 Ma, ana m agwa unu na Ịlaịja abịala n’eziokwu, ma ha amataghị ya, kama ha mere ya ihe masịrị ha.+ Otú a kwa ka ha ga-esi taa Nwa nke mmadụ ahụhụ.”+
-