5 “Lee, m na-ezitere unu Ịlaịja onye amụma+ tupu oké ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị dị egwu, abịa.+6 Ọ ga-eme ka obi ndị nna dịrị ka nke ụmụ,+ meekwa ka obi ụmụ dịrị ka nke ndị nna,* ka m wee ghara ịbịa tie ụwa ihe ma bibie ya.”
13 N’ihi na tupu oge Jọn, Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma* niile kwuru ihe ga-eme n’ọdịnihu.+14 Ma ùnu kwere ma unu ekweghị, Jọn bụ ‘Ịlaịja ahụ ndị amụma kwuru na ọ ga-abịa.’+
12 Ọ sịrị ha: “N’eziokwu, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa ma mee ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ.+ Ma gịnị mere e ji dee na Nwa nke mmadụ ga-ata nnukwu ahụhụ,+ e mesookwa ya ka onye a jụrụ ajụ?+
17 Chineke ga-emekwa ka nwa gị jiri ụdị obi na ike Ịlaịja nwere butere ya ụzọ,+ iji mee ka obi ndị nna dịrị ka nke ụmụ,*+ meekwa ka ndị na-enupụ isi kpawa àgwà ka ndị ma ihe na ndị ezi omume, iji kwadebere Jehova* otu ndị.”+