52 Ma mmadụ niile nọ na-ebe ákwá, na-eti aka n’obi, na-eru uju maka na ọ nwụọla. O wee sị ha: “Kwụsịnụ ibe ákwá,+ n’ihi na ọ nwụghị anwụ, kama ọ na-ehi ụra.”+ 53 Ha wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo, n’ihi na ha ma na ọ nwụọla. 54 Ma o seere ya n’aka ma sị ya: “Nwatakịrị, bilie!”+