23 Jizọs legharịrị anya ma gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ ga-esiri ndị nwere ego ezigbo ike ịbanye n’Alaeze Chineke.”+24 Ma, ihe a o kwuru juru ndị na-eso ụzọ ya anya. Jizọs gwaziri ha, sị: “Ụmụntakịrị, mmadụ ịba n’Alaeze Chineke siri ike.
9 Ma, a ga-anwata ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya, ha ga-amakwa n’ọnyà.+ Ihe ọjọọ ga na-agụ ha agụụ. Ha ga na-akpakwa àgwà ka ndị na-amaghị ihe. A ga-ejikwa maka ihe ndị a bibie ha, laakwa ha n’iyi.+