-
Matiu 19:28, 29Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
28 Jizọs sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, mgbe a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọdụ n’ocheeze ya dị ebube, ununwa ndị na-eso m ga-anọdụkwa n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.+ 29 Onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị nwoke ma ọ bụ ụmụnne ndị nwaanyị ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị ya okpukpu otu narị (100), nwetakwa ndụ ebighị ebi.+
-
-
Mak 10:29, 30Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 Jizọs sịrị: “N’eziokwu, ana m asị unu na e nweghị onye hapụrụ ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị nwoke ma ọ bụ ụmụnne ndị nwaanyị ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ubi n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma,+ 30 nke na-agaghị enweta okpukpu otu narị (100) ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwaanyị, nne, ụmụ, ubi, nakwa mkpagbu n’oge a,+ nwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.”*
-