33 “Lee, anyị na-agbago Jeruselem, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ ma nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ. 34 Ha ga-eji ya mee ihe ọchị, gbụọ ya asọ mmiri, pịa ya ihe, gbuokwa ya. Ma ụbọchị atọ gachaa, ọ ga-ebili.”+