17 Jizọs buuru osisi ịta ahụhụ gawa ebe a na-akpọ Ebe Okpokoro Isi.+ A na-akpọ ya Gọlgọta n’asụsụ Hibru.+ 18 Ha kpọgidere ya n’osisi n’ebe ahụ,+ ya na ụmụ nwoke abụọ ọzọ. Otu onye nọ ya n’otu akụkụ, onye nke ọzọ anọrọ n’akụkụ ya nke ọzọ, Jizọs anọrọ n’etiti.+