42 Ọ gwakwara anyị ka anyị kwusaara ndị mmadụ ozi ọma ma gbaa àmà nke ọma+ na onye a bụ onye Chineke kpebiri na ọ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.+
31 N’ihi na o wepụtala otu ụbọchị ọ ga-esi n’aka otu nwoke ọ họpụtara kpee mmadụ niile bi n’ụwa ikpe+ n’eleghị ha anya n’ihu. O meekwala ka obi sie mmadụ niile ike na ọ ga-eme ya, n’ihi na ọ kpọlitere nwoke ahụ n’ọnwụ.”+
10 N’ihi na anyị niile ga-eguzo n’ihu oche ikpe Kraịst, ka e kpee onye ọ bụla ikpe mgbe ọ ka dị ndụ n’ahụ́ anyị a, ma kpebie onye mere ihe ọma na onye mere ihe ọjọọ.+
4Kraịst Jizọs ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ+ ikpe+ mgbe ọ ga-apụta ìhè+ nakwa mgbe ọ ga na-achị n’Alaeze ya.+ Ana m agwasi gị ike n’ihu ya na n’ihu Chineke ka ị na-eme ihe a: