44 “N’oge ndị eze ahụ na-achị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze+ nke a na-agaghị ebibi ebibi+ malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ.+ Alaeze ahụ ga-egwepịa alaeze ndị a niile,+ mee ka ha ghara ịdịkwa, ma naanị ya ga-adịru mgbe ebighị ebi,+
14 E nyere ya ọchịchị,+ mee ka a na-akwanyere ya ùgwù,+ nyekwa ya alaeze, ka ndị dị iche iche, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi.+ Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị akwụsị akwụsị. A gaghịkwa ebibi alaeze ya ebibi.+