10 Mkpanaka eze agaghị apụ apụ na Juda,+ mkpara onye na-achị achị agaghịkwa apụ n’agbata ụkwụ ya, ruo mgbe Shaịlo* ga-abịa.+ Ọ* bụ ya ka mba dị iche iche ga-erubere isi.+
36 Jizọs zara,+ sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.+ A sị na Alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu.+ Ma, Alaeze m esighị n’ebe a.”
15 Mgbe mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ya,+ e nwere ndị ji oké olu si n’eluigwe kwuo, sị: “Alaeze ụwa aghọọla Alaeze nke Chineke+ na nke Kraịst ya.+ Chineke ga na-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”+
6 Ndị a ga-akpọlite ná mbilite n’ọnwụ mbụ ga-enwe obi ụtọ,+ dịrịkwa nsọ. Ha agaghị anwụ+ ọnwụ nke abụọ,*+ kama ha ga-abụ ndị nchụàjà+ Chineke na nke Kraịst. Ha ga-esokwa ya* bụrụ eze, chịakwa otu puku (1,000) afọ.+