18 Ma ụfọdụ ndị ọkachamara, bụ́ ndị òtù Epikurọs na ndị òtù Stoik, malitere ịrụ ya ụka. Ụfọdụ nọ na-asị: “Gịnị ka onye ekwurekwu a chọrọ ikwu?” Ndị ọzọ ana-asị: “Ọ dị ka ọ̀ na-ekwusa gbasara chi ndị mba ọzọ.” Ha na-ekwu ihe a maka na ọ na-ezisa ozi ọma banyere Jizọs na mbilite n’ọnwụ.+