-
Ọrụ Ndịozi 10:30-33Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
30 Kọnịliọs wee sị: “N’ụdị oge a n’abalị anọ gara aga, anọ m na-ekpe ekpere n’ụlọ m n’awa nke itoolu,* otu nwoke yi uwe na-enwu gbaa bịara guzoro n’ihu m 31 wee sị m: ‘Kọnịliọs, Chineke anụla ekpere gị, hụkwa otú i si na-enyere ndị ogbenye aka. 32 N’ihi ya, ziga ndị ozi Jọpa ka ha gaa kpọọ otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, onye a na-akpọkwa Pita. Ọ bụ ọbịa n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ.* Ụlọ nwoke a dị n’akụkụ oké osimiri.’+ 33 M wee zie ozi ozugbo ka a kpọọ gị. I meela otú i si bịa. Ugbu a, anyị niile agbakọtala n’ihu Chineke ịnụ ihe niile Jehova* gwara gị ka i kwuo.”
-