17 M na-ezitere unu Timoti n’ihi na ọ bụ nwa m m hụrụ n’anya, o jikwa obi ya niile na-ejere Onyenwe anyị ozi. Ọ ga-echetara unu otú m si ejere Kraịst Jizọs ozi,+ dị ka m si na-akụziri ọgbakọ niile.
2 Anyị ziteere unu Timoti,+ nwanna anyị na onye ozi Chineke* nke na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst, ka o mee ka unu kwụsie ike* ma kasie unu obi ka okwukwe unu sie ike,