-
Jenesis 24:2, 3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Ebreham gwara onye na-ejere ya ozi, onye kacha bụrụ okenye n’ezinụlọ ya, bụ́ onye na-elekọta ihe niile o nwere,+ sị: “Biko, tinye aka gị n’okpuru apata ụkwụ m,* 3 jiri aha Jehova, bụ́ Chineke nke eluigwe na ụwa, ṅụọrọ m iyi na ị gaghị alụtara nwa m nwoke otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị Kenan, bụ́ ndị m bi n’obodo ha.+
-
-
Nehemaya 13:25, 26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 M wee baara ha mba, bụọ ha ọnụ, tie ụfọdụ n’ime ụmụ nwoke ahụ ihe,+ fopụkwa ntutu isi ha ma mee ka ha jiri aha Chineke ṅụọ iyi. M sịrị ha: “Unu akpọnyela ụmụ ha ndị nwoke ụmụ unu ndị nwaanyị. Unu alụtakwarala ụmụ unu ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị. Unu alụkwala ụmụ ha ndị nwaanyị.+ 26 Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe ndị a mere ka Eze Solomọn nke Izrel mehie? E nweghị eze dị ka ya n’ọtụtụ mba.+ Chineke ya hụrụ ya n’anya+ wee mee ya eze Izrel niile. Ma ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ ọ lụrụ mere ka o mehie.+
-