13 N’ihi ya, ka anyị kwụsị ịna-ekpe ibe anyị ikpe,+ kama ka anyị kpebie na anyị agaghị edowe ihe mkpọbi ụkwụ n’ihu nwanna ma ọ bụ mee ihe ga-eme ka o mehie.+
20 Kwụsịnụ imebi ọrụ Chineke naanị n’ihi nri.+ N’eziokwu, ihe niile dị ọcha. Ma ọ dịghị mma ka mmadụ rie ihe ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka onye ọzọ zọhie ụkwụ.+