Abụ Ọma 33:2, 3 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Jirinụ ụbọ akwara na-ekele Jehova. Jirinụ ụbọ nwere akwara iri bụkuo ya abụ otuto. 3 Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ.+ Kpọọnụ ụbọ akwara ka ndị bụ́ aka ochie, tiekwanụ mkpu ọṅụ. Ọrụ Ndịozi 16:25 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 25 Ma n’ihe dị ka n’etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ na-ekpe ekpere ma jiri abụ na-eto Chineke.+ Ndị mkpọrọ nọkwa na-anụ olu ha. Ndị Kọlọsi 3:16 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 16 Kwenụ ka ihe Kraịst na-akụzi ju eju n’obi unu. Ọ ga-eme ka unu mara ihe. Jirinụ abụ ọma+ na abụ e ji eto Chineke, na nke e ji ekele ya, na-akụziri ibe unu ihe. Jirikwanụ ha na-agba ibe unu ume.* Jirinụ obi unu niile na-abụrụ Jehova* abụ.+ Jems 5:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 È nwere onye n’ime unu ihe na-esiri ike? Ya na-ekpe ekpere.+ È nwere onye obi dị ụtọ? Ya bụọ abụ e ji eto Chineke.+
2 Jirinụ ụbọ akwara na-ekele Jehova. Jirinụ ụbọ nwere akwara iri bụkuo ya abụ otuto. 3 Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ.+ Kpọọnụ ụbọ akwara ka ndị bụ́ aka ochie, tiekwanụ mkpu ọṅụ.
25 Ma n’ihe dị ka n’etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ na-ekpe ekpere ma jiri abụ na-eto Chineke.+ Ndị mkpọrọ nọkwa na-anụ olu ha.
16 Kwenụ ka ihe Kraịst na-akụzi ju eju n’obi unu. Ọ ga-eme ka unu mara ihe. Jirinụ abụ ọma+ na abụ e ji eto Chineke, na nke e ji ekele ya, na-akụziri ibe unu ihe. Jirikwanụ ha na-agba ibe unu ume.* Jirinụ obi unu niile na-abụrụ Jehova* abụ.+
13 È nwere onye n’ime unu ihe na-esiri ike? Ya na-ekpe ekpere.+ È nwere onye obi dị ụtọ? Ya bụọ abụ e ji eto Chineke.+