17 Ma amamihe nke si n’eluigwe na-ebu ụzọ eme ka obi mmadụ dị ọcha.+ Ọ na-emekwa ka onye ahụ na-eme udo,+ na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,+ na-eji obi ya niile erube isi, na-emetere ndị ọzọ ebere, na-eme ihe dị mma,+ ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu,+ gharakwa ịdị ihu abụọ.+