22 Ha nọ na-agba ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’ebe ndị ahụ ume+ ka ha sie ike n’okwukwe. Ha sịkwara ha: “Ọtụtụ nsogbu ga-abịara anyị tupu anyị abanye n’Alaeze Chineke.”+
9 N’ihi na ọ dị m ka Chineke emeela ka anyị bụ́ ndịozi bụrụ ndị ikpeazụ batara n’ámá egwuregwu ka mmadụ niile kiriwe anyị, maka na a mara anyị ikpe ọnwụ.+ Ụwa niile na ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ na-ekirikwa anyị.+
21 N’eziokwu, Chineke họọrọ unu ka unu na-eme otú a, n’ihi na Kraịst n’onwe ya tara ahụhụ maka unu.+ O gosiri unu ihe unu ga na-eme ka unu na-esosi nzọụkwụ ya ike.*+