13 N’eziokwu, ọ bụkwa ya mere anyị ji na-ekele Chineke mgbe niile,+ n’ihi na mgbe unu nụrụ okwu Chineke nke anyị gwara unu, unu nabatara ya, ọ bụghị ka okwu ụmụ mmadụ, kama ka okwu Chineke. N’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke, ọ na-akpakwa ike n’ime unu ndị kwere ekwe.