13 N’ezie, ọ bụ ya mere anyị jikwa na-ekele Chineke n’akwụsịghị akwụsị,+ n’ihi na mgbe unu natara okwu Chineke,+ bụ́ nke unu nụrụ n’ọnụ anyị, unu nabatara ya, ọ bụghị dị ka okwu ụmụ mmadụ,+ kama, dị nnọọ ka ọ bụ n’eziokwu, dị ka okwu Chineke, bụ́ nke na-arụkwa ọrụ n’ime unu ndị kwere ekwe.+