-
Mkpughe 12:10, 11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 Anụkwara m oké olu nke si n’eluigwe sị:
“Chineke anyị azọpụtala ndị mmadụ!+ O ji ike ya merie! Alaeze ya amalitela ịchị!+ Kraịst ya amalitela iji ikike o nwere akpa ike, n’ihi na a chụdala onye na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị!+ 11 Ha merikwara ya+ n’ihi ọbara Nwa Atụrụ ahụ,+ na n’ihi ozi ha zisara.+ Ha ahụghịkwa ndụ* ha n’anya.+ Ọ bụ ya mere na ha atụghị ụjọ ọnwụ.
-