Jeremaya
19 Jehova kwuru, sị: “Gaa zụta ite ụrọ n’aka ọkpụite.+ Kpọrọ ụfọdụ ndị a ma ama n’ime ndị m na ụfọdụ ndị a ma ama n’ime ndị nchụàjà 2 gaa na Ndagwurugwu Nwa Hinọm,+ nke dị n’ụzọ e si abanye n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ọkpụite. Nọrọ ebe ahụ kwusaa ihe a m na-aga ịgwa gị. 3 Kwuo, sị, ‘Ndị eze Juda na ndị bi na Jeruselem, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, sịrị:
“‘“M ga-eme ka ọdachi dakwasị obodo a, nke na ntị ọ bụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru. 4 M ga-eme ha ihe a maka na ha ahapụla m,+ meekwa ka a ghara ịmatazi ebe a.+ Ha na-anọ ebe a achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà, bụ́ chi ndị ha na ndị nna nna ha na ndị eze Juda na-amaghị. Ha emeekwala ka ọbara ndị aka ha dị ọcha ju ebe a.+ 5 Ha rụkwaara Bel ebe ndị dị elu ka ha nọrọ na ha na-eji ụmụ ha ndị nwoke achụrụ Bel àjà a na-esucha ọkụ.+ Ọ bụghị mụnwa gwara ha mewe ihe a. Agwaghị m ha gbasara ya. Ọ batatụbeghịkwa m n’obi.”’*+
6 “‘Jehova kwuru, sị: “N’ihi ya, oge na-abịa mgbe a na-agaghịzi na-akpọ ebe a Tofet ma ọ bụ Ndagwurugwu Nwa Hinọm, kama, a ga na-akpọzi ya Ndagwurugwu Igbu Mmadụ.+ 7 M ga-anọ ebe a kụghasịa atụmatụ ndị Juda na ndị bi na Jeruselem. M ga-emekwa ka ndị iro ha jiri mma agha gbuo ha, meekwa ka ndị na-achọ igbu ha* gbuo ha. M ga-enye nnụnụ na anụ ọhịa ozu ha ka ha rie.+ 8 M ga-eme obodo a ihe otú ọ ga-abụ, mmadụ hụ ya, ya eju ya anya, ya afụọkwa mkpọrọhịhị. Onye ọ bụla na-agafe na ya ga-ekporopụ anya na-ele ya ma fụọ mkpọrọhịhị n’ihi ahụhụ a tara ndị bi na ya.+ 9 M ga-eme ka ha na-eri anụ ụmụ ha ndị nwoke na nke ụmụ ha ndị nwaanyị. Mgbe ndị iro ha na ndị na-achọ igbu ha* ga-anọchibido ha, ihe ga-esiri ha ike. Ha agaghịkwa ahụ ihe ha ga-eri. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime ha ga na-eri anụ mmadụ ibe ya.”’+
10 “I kwuchaa ihe a, kụwaa ite ahụ n’ihu ndị ahụ so gị gaa. 11 Gwakwa ha, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “M ga-akụ obodo a na ndị bi na ya righirighi otú ahụ mmadụ si akụri ite ọkpụite kpụrụ nke na a gaghị emezili ya. A ga na-elikwa ozu ndị mmadụ na Tofet ruo mgbe a na-agaghịzi enwe ebe a ga-eli ha.”’+
12 “Jehova kwuru, sị, ‘Ihe ahụ ka m ga-eme ebe a na ndị bi na ya, ka obodo a dịrị ka Tofet. 13 Ụlọ ndị dị na Jeruselem na ụlọ ndị eze Juda ga-adị ka Tofet+ na-adịghị ọcha, ya bụ, ụlọ niile dị n’elu ụlọ, ebe ha na-achụrụ ihe ndị dị n’eluigwe àjà+ na ebe ha na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà mmanya.’”+
14 Mgbe Jeremaya si Tofet, bụ́ ebe Jehova ziri ya ka ọ gaa buo amụma, lọta, ọ gara guzoro n’ogige ụlọ Jehova gwa mmadụ niile, sị: 15 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ọdachi niile m kwuru okwu ya dakwasị obodo a na obodo niile gbara ya gburugburu, n’ihi na ha kpọrọ ekwo nkụ* jụ irubere m isi.’”+