Samuel nke Abụọ
22 Mgbe Jehova napụtachara Devid n’aka ndị iro ya niile+ nakwa n’aka Sọl,+ Devid bụkuru Jehova abụ.+ 2 Ọ bụrụ, sị:
“Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike+ na Onye na-anapụta m.+
3 Chineke m bụ oké nkume m.+ M na-agbaba n’ime ya.
Ọ bụ ọta m+ na mpi* nke na-azọpụta m.* Ọ bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m,+
Ọ bụ ebe m na-agbaga ọsọ ndụ+ na onye nzọpụta m.+ Ọ na-anapụta m n’aka ndị tigbuo zọgbuo.
4 M na-akpọku Jehova, onye e kwesịrị ịna-eto.
Ọ ga-anapụta m n’aka ndị iro m.
5 Ebili mmiri nke na-egbu mmadụ gbara m gburugburu.+
Ndị na-abaghị uru, bụ́ ndị yiri nnukwu idei mmiri, menyere m ụjọ.+
6 Ili* kere m ụdọ gburugburu.+
Ọnwụ siri ọnyà n’ihu m.+
7 N’oge m na-ata ahụhụ, m kpọrọ Jehova ka o nyere m aka.+
Chineke m ka m nọ na-akpọ ka o nyere m aka.
Ọ nọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m,
Ọ nụkwara mkpu m na-eti ka o nyere m aka.+
8 Ụwa malitere ịṅagharị na ịma jijiji.+
9 Anwụrụ ọkụ si n’imi ya kwụgoo elu.
Nnukwu ọkụ sikwa n’ọnụ ya na-apụta.+
Icheku ọkụ na-eke ọkụ n’ihu ya.
10 Ọ bịadara eluigwe mgbe ọ na-agbadata.+
Oké ọchịchịrị dịkwa n’okpuru ụkwụ ya.+
11 Ọ nọ n’elu cherob,+ fere efe bịa.
A hụrụ ya n’elu nku otu mmụọ ozi.+
12 O jizi ọchịchịrị kpuchie onwe ya otú ụlọikwuu si ekpuchi mmadụ,+
Jirikwa mmiri rujuru n’ígwé kpuchie onwe ya.
13 Ìhè dị n’ihu ya na-eme ka icheku ọkụ na-eke ọkụ.
14 Jehova wee nọrọ n’eluigwe malite ibigbọ.+
Onye Kacha Elu mere ka a nụ olu ya.+
15 Ọ gbapụrụ akụ́ ya+ wee chụsasịa ndị iro ya.
O mekwara ka àmụ̀mà gbuo, ha agharazie ịma ihe ha ga-eme eme.+
16 Mba Jehova bara na ume o kupụrụ+
Mere ka a hụ ala ala oké osimiri,+
Meekwa ka a hụ ntọala ụwa.
17 O si n’elu matịa aka ya.
O jidere m aka dọpụta m na mmiri miri emi.+
20 Ọ kpọpụtara m kpọba m ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme m.*+
Ọ napụtara m n’ihi na ihe m masịrị ya.+
21 Jehova na-akwụ m ụgwọ maka na m bụ onye ezi omume.+
Ọ na-akwụ m ụgwọ maka na aka m dị ọcha.+
22 M na-eme ihe dị Jehova mma,
Ahapụghịkwa m Chineke m, nke bụ́ ihe ọjọọ.
24 M ga na-eme ihe dị mma n’anya ya+ mgbe niile.
Agaghịkwa m eme ihe ọjọọ ọ bụla.+
26 Ị naghị ahapụ onye jisiri gị aka ike.+
Ị na-egosi onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta na ị bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.+
Ọ bụkwa gị, Jehova, na-eme ka ìhè nwuoro m n’ọchịchịrị.+
30 M ga-alụsoli ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ọgụ maka na ị na-enyere m aka.
M ga-awụfeli mgbidi n’ihi ike Chineke na-enye m.+
31 Ihe ezi Chineke na-eme zuru okè.+
Chineke bụụrụ ndị niile na-agbaba n’ime ya ọta.+
32 N’ihi na ònye bụ Chineke ma e wepụ Jehova?+
Ònyekwa bụ oké nkume ma e wepụ Chineke anyị?+
33 Ezi Chineke bụ ebe m a rụsiri ike.+
Ọ ga-emekwa ka ụzọ m kwụrụ ọtọ.+
34 Ọ na-eme ka ụkwụ m na-awụ ọsọ ka ụkwụ mgbada.
Ọ na-eme ka m guzoro n’ebe dị ezigbote elu.+
35 Ọ na-akụziri m* otú e si alụ agha.
Aka m na-ekweli ụta ọla kọpa.
36 Ị na-enye m ọta gị nke na-azọpụta m.
Otú i si dị umeala n’obi na-eme ka m bụrụ nnukwu mmadụ.+
38 M ga-achụ ndị iro m ọsọ, laakwa ha n’iyi.
Agaghị m alaghachi azụ ruo mgbe m kpochapụrụ ha.
39 M ga-ekpochapụ ha, gweriekwa ha ka ha ghara ibili.+
Ha ga-ada, mụ azọkwasị ha ụkwụ.
40 Ị ga-enye m ike m ga-eji alụ agha.+
Ị ga-eme ka ndị iro m daa n’ihu m.+
41 Ị ga-eme ka ndị iro m gbaghachi azụ n’ihi m.+
M ga-ebibikwa ndị kpọrọ m asị.+
42 Ha na-eti mkpu ka e nyere ha aka, ma e nweghị onye na-azọpụta ha.
Ha na-etiku Jehova, ma ọ naghị atụpụrụ ha ọnụ.+
43 M ga-asụri ha ka ha dị ka uzuzu dị n’ala.
M ga-egweri ha, zọpịakwa ha ka ha dị ka apịtị dị n’okporo ụzọ.
44 Ị ga-anapụta m n’aka ndị obodo anyị na-akatọ m.+
Ị ga-echebe m ka m bụrụ onyeisi nke mba dị iche iche.+
Ndị m na-amaghị ga-ejere m ozi.+
45 Ndị mba ọzọ ga-abịa, jiri ụjọ na-akpọrọ m isiala.+
Ihe ha na-anụ gbasara m ga-eme ka ha rubere m isi.
47 Jehova dị ndụ. Ka e too Oké Nkume m.+
Ka a jaa Chineke mma bụ́ oké nkume na-azọpụta m.+
48 Ezi Chineke na-abọrọ m ọbọ.+
Ọ na-eme ka ndị dị iche iche nọrọ n’okpuru m.+
49 Ọ na-anapụta m n’aka ndị iro m.
Chineke, ị na-ebugo m+ ebe aka ndị na-achọ imesi m ike na-agaghị eru.
Ị na-anapụta m n’aka onye chọrọ imerụ m ahụ́.+
50 Jehova, ọ bụ ya mere m ga-eji nọrọ ná mba dị iche iche kelee gị.+
M ga-abụkwa abụ iji too aha gị.+