Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 21
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Ihe a ga-eme ma ọ bụrụ na a maghị onye gburu mmadụ (1-9)

      • Ihe onye Izrel ga-eme ma ọ chọọ ịlụ nwaanyị a dọtara n’agha (10-14)

      • Ihe ruuru ọkpara (15-17)

      • Ihe a ga-eme nwa na-eme isi ike (18-21)

      • Onye a kwụwara n’osisi bụ onye a bụrụ ọnụ (22, 23)

Diuterọnọmi 21:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 16:18

Diuterọnọmi 21:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 35:33

Diuterọnọmi 21:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 28:1
  • +Ọg 6:23-27; 1Ih 23:13
  • +Di 17:8, 9

Diuterọnọmi 21:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 26:6; Mt 27:24

Diuterọnọmi 21:7

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Ọ bụghị anyị wụfuru ọbara a.”

Diuterọnọmi 21:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Sa 7:23
  • +Aịz 26:21; Jer 26:15

Diuterọnọmi 21:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 31:9; Di 20:13, 14

Diuterọnọmi 21:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 20:29; Di 34:8

Diuterọnọmi 21:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 24:1

Diuterọnọmi 21:15

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ya ahụ otu n’anya, kpọọ nke ọzọ asị.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 29:30, 33

Diuterọnọmi 21:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 25:31; 2Ih 21:3

Diuterọnọmi 21:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 20:12; Di 27:16; Ilu 1:8; Efe 6:1
  • +Di 8:5; Ilu 13:24; 19:18; 23:13; Hib 12:9

Diuterọnọmi 21:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 28:7
  • +Ro 13:13; 1Kọ 6:10; Efe 5:18

Diuterọnọmi 21:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 13:10, 11

Diuterọnọmi 21:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 25:5
  • +Jos 10:26; Ọrụ 10:39

Diuterọnọmi 21:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 8:29; Jn 19:31
  • +Ga 3:13
  • +Ọg 35:34

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 21:2Di 16:18
Diut. 21:4Ọg 35:33
Diut. 21:5Ọp 28:1
Diut. 21:5Ọg 6:23-27; 1Ih 23:13
Diut. 21:5Di 17:8, 9
Diut. 21:6Ọm 26:6; Mt 27:24
Diut. 21:82Sa 7:23
Diut. 21:8Aịz 26:21; Jer 26:15
Diut. 21:10Ọg 31:9; Di 20:13, 14
Diut. 21:13Ọg 20:29; Di 34:8
Diut. 21:14Di 24:1
Diut. 21:15Je 29:30, 33
Diut. 21:17Je 25:31; 2Ih 21:3
Diut. 21:18Ọp 20:12; Di 27:16; Ilu 1:8; Efe 6:1
Diut. 21:18Di 8:5; Ilu 13:24; 19:18; 23:13; Hib 12:9
Diut. 21:20Ilu 28:7
Diut. 21:20Ro 13:13; 1Kọ 6:10; Efe 5:18
Diut. 21:21Di 13:10, 11
Diut. 21:22Ọg 25:5
Diut. 21:22Jos 10:26; Ọrụ 10:39
Diut. 21:23Jos 8:29; Jn 19:31
Diut. 21:23Ga 3:13
Diut. 21:23Ọg 35:34
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 21:1-23

Diuterọnọmi

21 “Ọ bụrụ na a hụ onye e gburu egbu ka ọ tọgbọ n’ọhịa n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu, ma a maghị onye gburu ya, 2 ndị okenye unu na ndị ikpe unu+ ga-aga tụọ ebe ahụ, malite n’ebe onye ahụ nwụrụ anwụ tọgbọ ruo n’obodo ndị dị ya gburugburu. 3 Ndị okenye nke obodo kacha dịrị nso n’ebe onye ahụ nwụrụ anwụ tọgbọ ga-esi n’ìgwè ehi kpụta ehi a na-ejitụbeghị rụọ ọrụ, nke a na-anyakwasịtụbeghị yok. 4 Ndị okenye obodo ahụ ga-akpụrụ ehi ahụ gaa na ndagwurugwu nke iyi na-asọ na ya, bụ́ ebe a na-akọbeghị ihe, ebe a na-aghabeghịkwa mkpụrụ. Ha ga-akụjikwa ehi ahụ olu n’ebe ahụ, na ndagwurugwu ahụ.+

5 “Ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ga-abịa, n’ihi na ọ bụ ha ka Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ka ha na-ejere ya ozi,+ ka ha jiri aha Jehova na-agọzi ndị mmadụ.+ Ha ga-ekwu otú a ga-esi edozi esemokwu ọ bụla gbasara iti mmadụ ihe ma ọ bụ igbu mmadụ.+ 6 Ndị niile bụ́ ndị okenye n’obodo ahụ kacha nso n’ebe onye ahụ nwụrụ anwụ tọgbọ ga-akwọ aka ha+ n’elu ehi ahụ a kụjiri olu na ndagwurugwu ahụ. 7 Ha ga-asịkwa, ‘Ọ bụghị anyị gburu onye a.* Anyị ahụghịkwa mgbe e gburu ya. 8 Jehova, biko, emela ka ndị gị Izrel, bụ́ ndị ị napụtara,+ zaa ajụjụ maka onye a e gburu egbu. Emekwala ka ikpe ọbara onye aka ya dị ọcha ma ndị gị Izrel.’+ Ikpe ọbara ahụ agaghị ama ha. 9 Ọ bụrụ na unu emee ihe dị mma n’anya Jehova, unu ga-esi otú a mee ka ikpe ọbara onye aka ya dị ọcha ghara ịma unu.

10 “Ọ bụrụ na unu agaa lụso ndị iro unu agha, Jehova bụ́ Chineke unu ewee meriere unu ha, unu adọrọkwa ha n’agha,+ 11 gị ahụ nwaanyị mara mma ná ndị ahụ unu dọọrọ n’agha, ihe ya wee masị gị, gị achọọkwa ịkpọrọ ya ka ọ bụrụ nwunye gị, 12 i nwere ike ịkpọrọ ya laa n’ụlọ gị. Ọ ga-akpụ isi ya, bee mbọ́ ya, 13 yipụkwa ákwà o yi mgbe a dọọrọ ya n’agha, birizie n’ụlọ gị. Ọ ga-ebere nne ya na nna ya ákwá otu ọnwa zuru ezu.+ E mechaa, gị na ya nweziri ike inwe mmekọahụ. Ị ga-abụ di ya, ya abụrụ nwunye gị. 14 Ma ọ bụrụ na ihe ya adịghịzi gị mma, ị ga-ahapụ ya ka ọ gawa+ ebe ọ bụla ọ chọrọ. Ma ị gaghị ere ya ere ma ọ bụ megbuo ya, ebe ọ bụ na ị manyere ya ka ọ bụrụ nwunye gị.

15 “Ọ bụrụ na nwoke lụrụ nwaanyị abụọ, ya ahụ otu n’anya karịa ibe ya,* ya abụrụ na ha abụọ mụụrụ ya ụmụ nwoke, ya abụrụkwa nke ọ na-ahụchaghị n’anya mụụrụ ya ọkpara,+ 16 n’ụbọchị ọ ga-ekere ụmụ ya ndị nwoke ihe o nwere, a gaghị ekwe ka o were nwa nke nwaanyị ahụ ọ kacha hụ n’anya mere ọkpara ma hapụ nwa nke nwaanyị ahụ ọ na-ahụchaghị n’anya, bụ́ ọkpara ya. 17 O kwesịrị iwere nwa nke nwaanyị ahụ ọ na-ahụchaghị n’anya ka ọkpara ya ma kenye ya ụzọ abụọ nke ihe niile o nwere, n’ihi na ọ bụ ya ka o bu ụzọ mụọ. Ọ bụ ya nwe ihe ruuru ọkpara.+

18 “Ọ bụrụ na mmadụ nwere nwa nwoke na-eme isi ike, nke na-enupụ isi, ọ naghịkwa erubere nne ya ma ọ bụ nna ya isi,+ ha agbalịakwala dọọ ya aka ná ntị, ma o kweghị ege ha ntị,+ 19 nne ya na nna ya ga-akpọrọ ya kpọpụtara ndị okenye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ha. 20 Ha ga-agwa ndị okenye obodo ha, sị, ‘Nwa anyị nwoke a dị isi ike, na-enupụkwa isi, ọ naghịkwa erubere anyị isi. Ọ na-eri oké nri,+ bụrụkwa onye aṅụrụma.’+ 21 Ụmụ nwoke niile nọ n’obodo ha ga-eji nkume tụgbuo ya. Unu ga-esi otú ahụ wepụ ihe ọjọọ n’obodo unu. Ndị Izrel niile ga-anụ ihe merenụ wee tụọ egwu.+

22 “Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie ga-eme ka a ma ya ikpe ọnwụ, e wee gbuo ya,+ kwụwa ya n’osisi,+ 23 ozu ya agaghị adị n’elu osisi abalị niile.+ Kama, unu ga-ahụ na e liri ya n’ụbọchị ahụ, n’ihi na onye a kwụwara n’osisi bụ onye Chineke bụrụ ọnụ.+ Unu emerụla ala unu nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya