Abụ Solomọn
M tụrụ anya ya, ma ahụghị m ya.+
2 M ga-ebili gagharịa n’obodo.
M ga-achọ onye m hụrụ n’anya
N’okporo ámá nakwa n’ámá obodo.
M chọrọ ya, ma ahụghị m ya.
3 Ndị nche ndị na-agagharị n’obodo hụrụ m.+
M jụrụ ha, sị, ‘Ùnu hụrụ onye m hụrụ n’anya?’
4 Ozugbo m gafere ha,
M hụrụ onye m hụrụ n’anya.
M jidere ya aka. Ekweghị m ahapụ ya
Ruo mgbe m kpọbatara ya n’ụlọ nne m,+
N’ime ime ụlọ nwaanyị mụrụ m.
5 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, eji m ele na nne mgbada bi n’ọhịa
Na-arịọ unu ka unu ṅụọrọ m iyi
Na unu agaghị eme ka m hụ onye ọ bụla n’anya ebe ọ bụ na ọ dịbeghị m n’obi.”+
6 “Gịnị bụ ihe a si n’ala ịkpa na-abịa nke yiri anwụrụ ọkụ,
Nke e ji mea na frankinsens
Na ihe dị iche iche na-esi ísì ọma onye ahịa na-ere mee ka ọ na-esi ísì ọma?”+
7 “Lee, ọ bụ ihe e ji ebu Solomọn.
Ndị dike iri isii n’ime ndị dike Izrel
Gbara ya gburugburu.+
8 Ha niile ji mma agha.
Ha niile bụ ndị agha a zụrụ nke ọma.
Onye ọ bụla kere mma agha ya n’úkwù
Ka ha jiri ya chebe ya, ka ihe ọ bụla ghara imenye ya ụjọ n’abalị.”
9 “Ọ bụ ihe e ji ebu* Eze Solomọn.
O ji osisi si Lebanọn rụọrọ ya onwe ya.+
E ji ajị anụ na-acha pọpụl rụọ ebe a na-anọ ọdụ na ya.
Ụmụ nwaanyị Jeruselem mere ka ime ya
Maa ezigbote mma.”