Abụ Solomọn
3 “N’elu ihe ndina m n’abalị ka m chọworo onye ahụ mkpụrụ obi m hụrụ n’anya.+ M chọrọ ya, ma ahụghị m ya. 2 Biko, ka m bilie gagharịa n’obodo;+ ka m gagharịa n’okporo ámá nakwa n’ámá obodo+ chọọ onye mkpụrụ obi m hụrụ n’anya. M chọrọ ya, ma ahụghị m ya. 3 Ndị nche+ ndị na-agagharị n’obodo hụrụ m, ‘Ùnu hụrụ onye ahụ mkpụrụ obi m hụrụ n’anya?’ 4 Ozugbo m gafere ha ka m hụrụ onye mkpụrụ obi m hụrụ n’anya. Ejidere m ya aka, ekweghịkwa m ahapụ ya, ruo mgbe m kpọbatara ya n’ụlọ nne m nakwa n’ime ime ụlọ nke nwaanyị buru m n’afọ. 5 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ejiriwo m nne mgbada ma ọ bụ nne ele ndị bi n’ọhịa+ mee ka unu ṅụọ iyi,+ ka unu ghara ịkpọte ịhụnanya dị n’ime m ma ọ bụ kpalie ya ruo mgbe ọ chọrọ.”+
6 “Gịnị bụ ihe a si n’ala ịkpa na-apụta dị ka anwụrụ ọkụ, bụ́ nke e ji mea na frankinsens mee ka ọ na-esi ísì ụtọ,+ ọbụna ụdị paụda niile na-esi ísì ụtọ nke onye ahịa?”+
7 “Lee! Ọ bụ ihe ndina ya, nke Sọlọmọn. Ndị dike iri isii gbara ya gburugburu, bụ́ ndị so ná ndị dike Izrel,+ 8 ha niile ji mma agha, ebe a kụziiri ha ibu agha, onye ọ bụla kere mma agha ya n’úkwù n’ihi ụjọ a na-atụ n’abalị.”+
9 “Ọ bụ ihe e ji ebu Eze Sọlọmọn, nke o ji osisi Lebanọn rụọ.+ 10 O ji ọlaọcha mee ụkwụ ya, jirikwa ọlaedo mee ihe ndabere ya. E ji ákwà e sijiri odo odo mee ebe a na-anọ ọdụ na ya, ụmụ nwaanyị Jeruselem doziri ime ya, ya amaa mma.”
11 “Ụmụ nwaanyị Zayọn, gaanụ hụ Eze Sọlọmọn ka o kpu okpu+ nne ya+ kpaara ya n’ụbọchị ọ lụrụ nwaanyị nakwa n’ụbọchị obi ya ṅụrịrị ọṅụ.”+