Abụ Solomọn
Ewetala m mea na ahịhịa na-esi ísì ọma.+
Arachaala m mmanụ aṅụ m, mịchaakwa ụgbụgbọ ya.
Aṅụọla m mmanya m na mmiri ara ehi m.”+
“Ndị enyi anyị, rienụ ihe.
Ṅụọnụ mmanya, ka ịhụnanya gbuokwa unu ka mmanya.”+
2 “Ana m arahụ ụra, ma obi m na-awagharị.+
M wee nụ aka onye m hụrụ n’anya na-akụ n’ụzọ.
‘Nwanne m nwaanyị, onye m hụrụ n’anya, megheere m ụzọ,
Nduru m, onye na-enweghị ntụpọ.
N’ihi na igirigi edeela isi m.
Igirigi nke dara n’abalị edeela ntutu isi m.’+
3 Eyipụla m uwe m.
M̀ ga-eyiri ya ọzọ?
Asaala m ụkwụ m.
M̀ ga-emetọsị ya ọzọ?
4 Onye m hụrụ n’anya seere aka ya n’oghere ụzọ.
O wee gụsiwe m ike ịhụ ya.
5 M biliri ọtọ ka m megheere onye m hụrụ n’anya ụzọ;
Mmanụ mea esi n’aka m na-agụsị,
Mmanụ mea esikwa ná mkpịsị aka m na-agụsị,
Na-atasa n’ihe e ji kpọchie ụzọ.
6 M megheere onye m hụrụ n’anya ụzọ,
Ma onye m hụrụ n’anya apụọla, ọ laala.
Obi mapụrụ m mgbe ọ pụrụ.*
M chọrọ ya, ma ahụghị m ya.+
M kpọrọ ya òkù, ma ọ zaghị m.
7 Ndị nche ndị na-agagharị n’obodo hụrụ m.
Ha tiri m ihe. Ha merụrụ m ahụ́.
Ndị na-eche nche ná mgbidi dọpụrụ m ákwà m wụkwasịrị n’ahụ́.
8 “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ṅụọrọnụ m iyi
Na ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ n’anya
Na unu ga-agwa ya na anaghị m enweta onwe m maka na ọ nọghị m nso.”
9 “Gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma,
Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara nwoke ọ bụla ọzọ mma?
Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara nwoke ọ bụla ọzọ mma
Nke mere i ji agwa anyị ka anyị ṅụọ ụdị iyi a?”
10 “Onye m hụrụ n’anya bụ sọ mma, ahụ́ ya na-egbukekwa egbuke;*
Ọ bụ ọpụrụiche n’ime puku ụmụ nwoke iri.
11 Isi ya mara mma ka ọlaedo, ka ọlaedo kacha mma.
Ntutu isi ya dị ka igu nkwụ ifufe na-ebugharị,
Ntutu isi ya dịkwa oji ka ugoloọma.
12 Anya ya yiri nduru ndị nọ n’akụkụ iyi,
Ndị na-asa ahụ́ n’ime mmiri ara ehi,
Ndị nọ n’akụkụ ọdọ mmiri nke mmiri juru.
Egbugbere ọnụ ya dị ka okooko lili, nke mmanụ mea si na ya na-atasị.+
14 Mkpịsị aka ya dị ka ọlaedo, nke e ji nkume krisolaịt chọọ mma.
Afọ ya dị ka ọdụ́ e ji safaya kpuchie.
15 Ụkwụ ya dị ka ogidi ndị e ji mabụl rụọ, ndị e jikwa ọlaedo kacha mma rụọ ebe ala ha.
Ọ mara mma ka Lebanọn. O nweghị atụ ka osisi sida.+
Ihe niile banyere ya magburu onwe ya.+
Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ọ bụ onye a bụ onye m hụrụ n’anya. Ọ bụ ya bụ ọdị m n’obi.”