Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Abụ Solomọn 5
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Abụ Solomọn

    • MGBE NWA AGBỌGHỌ SHULEM NỌ NA JERUSELEM (3:6–8:4)

Abụ Solomọn 5:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 4:16
  • +So 4:13, 14
  • +So 4:11
  • +So 1:2

Abụ Solomọn 5:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 3:1
  • +Lu 2:8

Abụ Solomọn 5:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ, “mgbe o kwuru okwu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 3:1, 3

Abụ Solomọn 5:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “na-acha uhie uhie.”

Abụ Solomọn 5:12

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    1/15/2015, p. 29-30

    11/15/2006, p. 19

Abụ Solomọn 5:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 6:2
  • +So 1:13

Abụ Solomọn 5:14

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/2006, p. 19

Abụ Solomọn 5:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 92:12

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/2006, p. 19

Abụ Solomọn 5:16

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Okpo ọnụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 2:3

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Abụ Solo. 5:1So 4:16
Abụ Solo. 5:1So 4:13, 14
Abụ Solo. 5:1So 4:11
Abụ Solo. 5:1So 1:2
Abụ Solo. 5:2So 3:1
Abụ Solo. 5:2Lu 2:8
Abụ Solo. 5:6So 3:1, 3
Abụ Solo. 5:13So 6:2
Abụ Solo. 5:13So 1:13
Abụ Solo. 5:15Ọm 92:12
Abụ Solo. 5:16So 2:3
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Abụ Solomọn 5:1-16

Abụ Solomọn

5 “Nwanne m nwaanyị, nwaanyị m ga-alụ,

Abatala m n’ubi m.+

Ewetala m mea na ahịhịa na-esi ísì ọma.+

Arachaala m mmanụ aṅụ m, mịchaakwa ụgbụgbọ ya.

Aṅụọla m mmanya m na mmiri ara ehi m.”+

“Ndị enyi anyị, rienụ ihe.

Ṅụọnụ mmanya, ka ịhụnanya gbuokwa unu ka mmanya.”+

 2 “Ana m arahụ ụra, ma obi m na-awagharị.+

M wee nụ aka onye m hụrụ n’anya na-akụ n’ụzọ.

‘Nwanne m nwaanyị, onye m hụrụ n’anya, megheere m ụzọ,

Nduru m, onye na-enweghị ntụpọ.

N’ihi na igirigi edeela isi m.

Igirigi nke dara n’abalị edeela ntutu isi m.’+

 3 Eyipụla m uwe m.

M̀ ga-eyiri ya ọzọ?

Asaala m ụkwụ m.

M̀ ga-emetọsị ya ọzọ?

 4 Onye m hụrụ n’anya seere aka ya n’oghere ụzọ.

O wee gụsiwe m ike ịhụ ya.

 5 M biliri ọtọ ka m megheere onye m hụrụ n’anya ụzọ;

Mmanụ mea esi n’aka m na-agụsị,

Mmanụ mea esikwa ná mkpịsị aka m na-agụsị,

Na-atasa n’ihe e ji kpọchie ụzọ.

 6 M megheere onye m hụrụ n’anya ụzọ,

Ma onye m hụrụ n’anya apụọla, ọ laala.

Obi mapụrụ m mgbe ọ pụrụ.*

M chọrọ ya, ma ahụghị m ya.+

M kpọrọ ya òkù, ma ọ zaghị m.

 7 Ndị nche ndị na-agagharị n’obodo hụrụ m.

Ha tiri m ihe. Ha merụrụ m ahụ́.

Ndị na-eche nche ná mgbidi dọpụrụ m ákwà m wụkwasịrị n’ahụ́.

 8 “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ṅụọrọnụ m iyi

Na ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ n’anya

Na unu ga-agwa ya na anaghị m enweta onwe m maka na ọ nọghị m nso.”

 9 “Gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma,

Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara nwoke ọ bụla ọzọ mma?

Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara nwoke ọ bụla ọzọ mma

Nke mere i ji agwa anyị ka anyị ṅụọ ụdị iyi a?”

10 “Onye m hụrụ n’anya bụ sọ mma, ahụ́ ya na-egbukekwa egbuke;*

Ọ bụ ọpụrụiche n’ime puku ụmụ nwoke iri.

11 Isi ya mara mma ka ọlaedo, ka ọlaedo kacha mma.

Ntutu isi ya dị ka igu nkwụ ifufe na-ebugharị,

Ntutu isi ya dịkwa oji ka ugoloọma.

12 Anya ya yiri nduru ndị nọ n’akụkụ iyi,

Ndị na-asa ahụ́ n’ime mmiri ara ehi,

Ndị nọ n’akụkụ ọdọ mmiri nke mmiri juru.

13 Ntì ya dị ka ebe a kụrụ ahịhịa ndị na-esi ísì ọma,+

Ka ubi a kụrụ ahịhịa ndị na-esi ísì ọma.

Egbugbere ọnụ ya dị ka okooko lili, nke mmanụ mea si na ya na-atasị.+

14 Mkpịsị aka ya dị ka ọlaedo, nke e ji nkume krisolaịt chọọ mma.

Afọ ya dị ka ọdụ́ e ji safaya kpuchie.

15 Ụkwụ ya dị ka ogidi ndị e ji mabụl rụọ, ndị e jikwa ọlaedo kacha mma rụọ ebe ala ha.

Ọ mara mma ka Lebanọn. O nweghị atụ ka osisi sida.+

16 Ọnụ* ya dị ezigbo ụtọ.

Ihe niile banyere ya magburu onwe ya.+

Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ọ bụ onye a bụ onye m hụrụ n’anya. Ọ bụ ya bụ ọdị m n’obi.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya