Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ihe E Mere 31
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

      • Hezekaya bibiri ihe ndị e ji efe arụsị (1)

      • A malitere ilekọta ndị nchụàjà na ndị Livaị nke ọma (2-21)

2 Ihe E Mere 31:1

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 23:24
  • +Di 7:5; 2Ez 18:1, 4; 2Ih 14:2, 3; 34:1, 3
  • +Di 12:2
  • +2Ih 23:16, 17
  • +2Ih 30:1, 18

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị, 5/2023, p. 7-8

2 Ihe E Mere 31:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 23:6; 24:1
  • +2Ih 8:14
  • +1Ih 23:13, 27-30

2 Ihe E Mere 31:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 30:24
  • +Ọp 29:39
  • +Ọg 28:9
  • +Ọg 10:10
  • +Di 16:16

2 Ihe E Mere 31:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 18:21; Neh 10:38, 39

2 Ihe E Mere 31:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 18:12
  • +Ọp 22:29; 23:19; Neh 10:37
  • +Ilu 3:9

2 Ihe E Mere 31:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 27:30; Di 14:28

2 Ihe E Mere 31:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 23:16
  • +Le 23:24

2 Ihe E Mere 31:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 18:8
  • +Mal 3:10

2 Ihe E Mere 31:11

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ebe ndị a na-anọ eri nri.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Neh 10:38, 39; 12:44

2 Ihe E Mere 31:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 27:30; Di 14:28

2 Ihe E Mere 31:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 26:17, 19
  • +Di 12:5, 6; 16:10
  • +Ọg 18:8
  • +Le 2:10; 7:1

2 Ihe E Mere 31:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 21:19
  • +1Ih 24:1

2 Ihe E Mere 31:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 24:4
  • +Ọg 4:2, 3; 8:24; 1Ih 23:24
  • +1Ih 23:6

2 Ihe E Mere 31:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 25:33, 34; Ọg 35:2; Jos 21:13

2 Ihe E Mere 31:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 29:35

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Ihe 31:1Ọp 23:24
2 Ihe 31:1Di 7:5; 2Ez 18:1, 4; 2Ih 14:2, 3; 34:1, 3
2 Ihe 31:1Di 12:2
2 Ihe 31:12Ih 23:16, 17
2 Ihe 31:12Ih 30:1, 18
2 Ihe 31:21Ih 23:6; 24:1
2 Ihe 31:22Ih 8:14
2 Ihe 31:21Ih 23:13, 27-30
2 Ihe 31:32Ih 30:24
2 Ihe 31:3Ọp 29:39
2 Ihe 31:3Ọg 28:9
2 Ihe 31:3Ọg 10:10
2 Ihe 31:3Di 16:16
2 Ihe 31:4Ọg 18:21; Neh 10:38, 39
2 Ihe 31:5Ọg 18:12
2 Ihe 31:5Ọp 22:29; 23:19; Neh 10:37
2 Ihe 31:5Ilu 3:9
2 Ihe 31:6Le 27:30; Di 14:28
2 Ihe 31:7Le 23:16
2 Ihe 31:7Le 23:24
2 Ihe 31:10Ọg 18:8
2 Ihe 31:10Mal 3:10
2 Ihe 31:11Neh 10:38, 39; 12:44
2 Ihe 31:12Le 27:30; Di 14:28
2 Ihe 31:141Ih 26:17, 19
2 Ihe 31:14Di 12:5, 6; 16:10
2 Ihe 31:14Ọg 18:8
2 Ihe 31:14Le 2:10; 7:1
2 Ihe 31:15Jos 21:19
2 Ihe 31:151Ih 24:1
2 Ihe 31:171Ih 24:4
2 Ihe 31:17Ọg 4:2, 3; 8:24; 1Ih 23:24
2 Ihe 31:171Ih 23:6
2 Ihe 31:19Le 25:33, 34; Ọg 35:2; Jos 21:13
2 Ihe 31:212Ih 29:35
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ihe E Mere 31:1-21

Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Abụọ

31 Ozugbo ha mechara ihe a niile, ndị Izrel niile ndị bịara ebe ahụ gara n’obodo ndị dị na Juda kụtuo ogidi arụsị dị iche iche,+ gbutuokwa ogwe osisi arụsị* dị iche iche+ ma kwatuo ebe ndị dị elu+ na ebe ịchụàjà+ ndị dị na Juda na Benjamin niile, nakwa n’Ifrem na Manase+ ruo mgbe ha bibichara ha niile. E mechaa, ndị Izrel niile laghachiri n’obodo ha. Onye nke ọ bụla laghachiri n’ụlọ ya.

2 Hezekaya bịara kee ndị nchụàjà na ndị Livaị n’ìgwè n’ìgwè.+ O kenyere onye nchụàjà nke ọ bụla na onye Livaị nke ọ bụla ọrụ ha ga na-arụ n’otu n’otu.+ Ọrụ ha ga-abụ ịchụ àjà a na-esu ọkụ, ịchụ àjà udo, ije ozi n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ nsọ nakwa ịnọ ebe ahụ na-ekele Jehova ma na-eto ya.+ 3 Eze sikwa n’akụ̀ ya nye ihe a ga-eji na-achụ àjà a na-esu ọkụ,+ ma àjà nke a na-esu ọkụ n’ụtụtụ ma nke mgbede,+ ma nke a na-achụ n’Ụbọchị Izu Ike,+ ma nke a na-achụ n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ,+ ma nke a na-achụ n’oge ememme dị iche iche,+ otú e dere n’Iwu Jehova.

4 Ọ gwakwara ndị bi na Jeruselem ka ha na-ewetara ndị nchụàjà na ndị Livaị ihe e kwesịrị ịna-enye ha,+ ka ha wee na-edebezu iwu Jehova. 5 Ozugbo ndị Izrel nụrụ ihe a, ha malitere iweta mkpụrụ mbụ si n’ọka ha wetara n’ubi, mmanya ọhụrụ, mmanụ,+ mmanụ aṅụ, na ihe ndị ọzọ niile ha wetara n’ubi.+ Ha wetakwara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile. Ihe niile ha wetara hiri nne.+ 6 Ndị Izrel na ndị Juda ndị bi n’obodo ndị dị na Juda wetara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ehi ha na atụrụ ha. Ha wetakwara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị dị nsọ,+ ya bụ, ihe ndị e dooro Jehova bụ́ Chineke ha nsọ. Ha wetara ha, tụkọta ha n’ikpo n’ikpo. 7 Ha malitere ịtụkọta ha n’ikpo n’ikpo n’ọnwa nke atọ.+ Ha tụkọtachara ha n’ọnwa nke asaa.+ 8 Mgbe Hezekaya na ndị isi hụrụ ikpo ndị ahụ, ha toro Jehova, gọziekwa ndị Izrel bụ́ ndị ya.

9 Hezekaya jụrụ ndị nchụàjà na ndị Livaị otú e si nweta ihe ndị ahụ niile. 10 Azaraya onyeisi nchụàjà, onye si n’ezinụlọ Zedọk, asị ya: “Kemgbe ndị mmadụ malitere iweta onyinye n’ụlọ Jehova,+ ha na-eri nri na-eriju afọ, na-erifọkwa ihe buru ibu, n’ihi na Jehova agọziela ndị ya. Nnukwu ihe a bụkwa ihe fọrọ afọ.”+

11 Hezekaya wee gwa ha ka ha dozie ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe*+ n’ụlọ Jehova. Ha wee dozie ha. 12 Ha nọgidere na-eweta onyinye na otu ụzọ n’ụzọ iri+ nakwa ihe ndị dị nsọ. Konanaya onye Livaị na-elekọta ihe a niile. Shimiaị nwanne ya na-esote ya. 13 Jehayel, Azazaya, Nehat, Asahel, Jerimọt, Jozabad, Iliel, Ismakaya, Mehat, na Benaya bụ ndị nlekọta na-enyere Konanaya na Shimiaị nwanne ya aka, otú Eze Hezekaya kwuru ka ha na-eme. Azaraya bụkwa onye nlekọta n’ụlọ ezi Chineke. 14 Kore nwa Imna, onye Livaị nke na-eche ọnụ ụzọ ámá dị ebe ọwụwa anyanwụ nche,+ na-ahụ maka onyinye ndị mmadụ ji obi ha niile nye+ ezi Chineke. Ọ na-ekesakwa ma onyinye e nyere Jehova+ ma ihe ndị kacha nsọ.+ 15 Ndị nọ n’okpuru ya bụ Iden, Minayamin, Jeshụa, Shemaya, Amaraya, na Shekanaya. Ha nọ n’obodo dị iche iche ndị nchụàjà nwe.+ Ha na-arụ ọrụ ndị a tụkwasịrị obi na-arụ, ya bụ, ikesara ụmụnne ha ihe n’ìgwè ha dị iche iche,+ ma onye ukwu ma onye nta. 16 Ndị ọzọ ha na-ekesara ihe bụ ụmụ nwoke ndị e debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche, malite ná ndị dị afọ atọ gbagowe. Ndị a na-abịa eje ozi n’ụlọ Jehova kwa ụbọchị, na-arụkwa ọrụ e kenyere ìgwè ha dị iche iche.

17 E debara aha ndị nchụàjà n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche n’ọnụmara n’ọnụmara.+ Otú ahụkwa ka e si deba aha ndị Livaị n’akwụkwọ, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe.+ E dekwara aha ha otú e si kenye ha ọrụ n’ìgwè n’ìgwè.+ 18 E debakwara aha ezinụlọ ndị Livaị niile n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche, ma ụmụaka ha, ma ndị nwunye ha, ma ụmụ ha ndị nwoke, ma ụmụ ha ndị nwaanyị. Ha na-edo onwe ha nsọ mgbe niile maka ọrụ dị nsọ ha na-arụ, ya bụ, ọrụ ndị a tụkwasịrị obi na-arụ. 19 E debakwara aha ndị si n’ezinụlọ Erọn n’akwụkwọ. Ha bụ ndị nchụàjà, ndị bi n’ala ebe anụmanụ na-ata ahịhịa gburugburu obodo ha.+ N’obodo ndị ahụ niile, a họpụtara ụfọdụ ụmụ nwoke ka ha na-ekesara ndị nchụàjà nri, na-ekesakwara ndị Livaị niile e debara aha ha n’akwụkwọ e dere aha ezinụlọ ha dị iche iche.

20 Hezekaya mere ihe a n’ebe niile na Juda. Ọ nọkwa na-eme ihe dị mma na ihe ziri ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke ya. Ọ kwụsịghịkwa irubere ya isi. 21 O ji obi ya niile rụọ ọrụ niile gbasara ife Chineke ya, ma nke metụtara ozi a na-eje n’ụlọ ezi Chineke+ ma nke metụtara idebe iwu ya na iso ntụziaka ya. Ihe gazikwaara ya.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya