Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 30
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • Nkwa nwoke kwere (1, 2)

      • Nkwa nwaanyị ma ọ bụ nwa agbọghọ kwere (3-16)

Ọnụ Ọgụgụ 30:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 18:25

Ọnụ Ọgụgụ 30:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 28:20-22; Ikp 11:30, 31
  • +Ọm 132:1-5
  • +Di 23:21; Ọm 116:14; 119:106; Ek 5:4; Mt 5:33
  • +Ọm 50:14; 66:13

Ọnụ Ọgụgụ 30:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 20:12

Ọnụ Ọgụgụ 30:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ro 7:2; 1Kọ 11:3; Efe 5:22

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/1/2004, p. 27

Ọnụ Ọgụgụ 30:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, nwaanyị nọ na di.

Ọnụ Ọgụgụ 30:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Kọ 11:3; 1Pi 3:1

Ọnụ Ọgụgụ 30:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 23:21

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 30:1Ọp 18:25
Ọnụ Ọgụ. 30:2Je 28:20-22; Ikp 11:30, 31
Ọnụ Ọgụ. 30:2Ọm 132:1-5
Ọnụ Ọgụ. 30:2Di 23:21; Ọm 116:14; 119:106; Ek 5:4; Mt 5:33
Ọnụ Ọgụ. 30:2Ọm 50:14; 66:13
Ọnụ Ọgụ. 30:5Ọp 20:12
Ọnụ Ọgụ. 30:8Ro 7:2; 1Kọ 11:3; Efe 5:22
Ọnụ Ọgụ. 30:121Kọ 11:3; 1Pi 3:1
Ọnụ Ọgụ. 30:15Di 23:21
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 30:1-16

Ọnụ Ọgụgụ

30 Mosis wee gwa ndị isi+ ebo dị iche iche e nwere n’Izrel, sị: “Ihe a bụ ihe Jehova nyere n’iwu: 2 Ọ bụrụ na nwoke ekwe Jehova nkwa+ ma ọ bụ ṅụọ iyi+ na e nwere ihe ya na-agaghị eme, ya ahapụla ime ihe o kwuru.+ O kwesịrị imezu ihe niile o kwere nkwa na ya ga-eme.+

3 “Ọ bụrụkwa na nwaanyị nke bi n’ụlọ nna ya ekwe Jehova nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi mgbe ọ bụ agbọghọ na e nwere ihe ya na-agaghị eme, 4 nna ya ewee nụ nkwa o kwere ma ọ bụ iyi ọ ṅụrụ na e nwere ihe ọ na-agaghị eme, ma nna ya ekwughị na nwa ya agaghị emezu ihe ahụ o kwuru, nkwa niile nwa ya nwaanyị ahụ kwere agaghị agbanwe, iyi ọ ṅụrụ na e nwere ihe ọ na-agaghị eme agaghịkwa agbanwe. 5 Ma ọ bụrụ na nna ya anụ na o kwere nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi na e nwere ihe ọ na-agaghị eme, ma nna ya ajụ na ọ gaghị emezu ihe ahụ o kwuru, ihe ahụ nwaanyị ahụ kwuru agaghị enwe isi. Jehova ga-agbaghara ya maka na nna ya ekweghị.+

6 “Ma, ọ bụrụ na tupu ya alụọ di na o kwere nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi n’echeghị echiche na e nwere ihe ya na-agaghị eme, 7 di ya ewee nụ ya, ma o kwughị n’ụbọchị ọ nụrụ ihe ahụ na nwunye ya agaghị emezu ya, nkwa nwaanyị ahụ kwere ma ọ bụ iyi ọ ṅụrụ na e nwere ihe ya na-agaghị eme agaghị agbanwe. 8 Ma ọ bụrụ na n’ụbọchị di ya nụrụ ya, na ọ jụrụ na nwunye ya agaghị eme ihe ahụ o kwuru, di ya akagbuola nkwa ahụ nwunye ya kwere ma ọ bụ iyi ahụ ọ ṅụrụ n’echeghị echiche.+ Jehova ga-agbaghara nwaanyị ahụ.

9 “Ma ọ bụrụ na nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwaanyị a gbara alụkwaghịm ekwe nkwa, nkwa ọ bụla o kwere na e nwere ihe ya na-agaghị eme agaghị agbanwe.

10 “Ma, ọ bụrụ na nwaanyị nke nọ n’ụlọ di ya* ekwe nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi na e nwere ihe ya na-agaghị eme, 11 di ya ewee nụ ya, ma ọ kagbughị ihe ahụ nwunye ya kwuru, o kwughịkwa na nwunye ya agaghị eme ihe ahụ, nkwa niile nwaanyị ahụ kwere ma ọ bụ iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na e nwere ihe ya na-agaghị eme agaghị agbanwe. 12 Ma ọ bụrụ na n’ụbọchị di ya nụrụ ihe ahụ o kwuru, na ọ kagburu nkwa ọ bụla nwunye ya kwere ma ọ bụ iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na e nwere ihe ya na-agaghị eme, nkwa ahụ ma ọ bụ iyi ahụ agaghịzi enwe isi.+ Di ya akagbuola ya, Jehova ga-agbagharakwa nwaanyị ahụ. 13 Ọ bụ di ya ga-ekwu ma nkwa ọ bụla o kwere ma ọ bụ iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na ya agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya ọ̀ ga-enwe isi ma ọ bụ na ọ gaghị enwe isi. 14 Ma ọ bụrụ na ka ụbọchị na-aga, na di ya ekwughị na nwunye ya agaghị emezu nkwa ahụ, o kwetala ka nwunye ya mezuo nkwa niile o kwere ma ọ bụ iyi niile ọ ṅụrụ na e nwere ihe ọ na-agaghị eme. Otú o si kweta bụ na n’ụbọchị ọ nụrụ ihe nwunye ya kwuru, o kwughị na nwunye ya agaghị eme ihe ahụ. 15 Ma ọ bụrụ na di ya mechara kagbuo ihe nwunye ya kwuru mgbe ụbọchị ọ nụrụ ihe nwunye ya kwuru gaferela, ọ ga-eburu nsogbu ga-esi ná mmehie nwaanyị ahụ pụta.+

16 “Ihe ndị a bụ iwu Jehova nyere Mosis gbasara di na nwunye nakwa gbasara nna na nwa ya nwaanyị, bụ́ nwa agbọghọ ya na ya bi n’ụlọ.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya