Ọnụ Ọgụgụ
30 Mosis wee gwa ndị isi+ ebo dị iche iche e nwere n’Izrel, sị: “Ihe a bụ ihe Jehova nyere n’iwu: 2 Ọ bụrụ na nwoke ekwe Jehova nkwa+ ma ọ bụ ṅụọ iyi+ na e nwere ihe ya na-agaghị eme, ya ahapụla ime ihe o kwuru.+ O kwesịrị imezu ihe niile o kwere nkwa na ya ga-eme.+
3 “Ọ bụrụkwa na nwaanyị nke bi n’ụlọ nna ya ekwe Jehova nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi mgbe ọ bụ agbọghọ na e nwere ihe ya na-agaghị eme, 4 nna ya ewee nụ nkwa o kwere ma ọ bụ iyi ọ ṅụrụ na e nwere ihe ọ na-agaghị eme, ma nna ya ekwughị na nwa ya agaghị emezu ihe ahụ o kwuru, nkwa niile nwa ya nwaanyị ahụ kwere agaghị agbanwe, iyi ọ ṅụrụ na e nwere ihe ọ na-agaghị eme agaghịkwa agbanwe. 5 Ma ọ bụrụ na nna ya anụ na o kwere nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi na e nwere ihe ọ na-agaghị eme, ma nna ya ajụ na ọ gaghị emezu ihe ahụ o kwuru, ihe ahụ nwaanyị ahụ kwuru agaghị enwe isi. Jehova ga-agbaghara ya maka na nna ya ekweghị.+
6 “Ma, ọ bụrụ na tupu ya alụọ di na o kwere nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi n’echeghị echiche na e nwere ihe ya na-agaghị eme, 7 di ya ewee nụ ya, ma o kwughị n’ụbọchị ọ nụrụ ihe ahụ na nwunye ya agaghị emezu ya, nkwa nwaanyị ahụ kwere ma ọ bụ iyi ọ ṅụrụ na e nwere ihe ya na-agaghị eme agaghị agbanwe. 8 Ma ọ bụrụ na n’ụbọchị di ya nụrụ ya, na ọ jụrụ na nwunye ya agaghị eme ihe ahụ o kwuru, di ya akagbuola nkwa ahụ nwunye ya kwere ma ọ bụ iyi ahụ ọ ṅụrụ n’echeghị echiche.+ Jehova ga-agbaghara nwaanyị ahụ.
9 “Ma ọ bụrụ na nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwaanyị a gbara alụkwaghịm ekwe nkwa, nkwa ọ bụla o kwere na e nwere ihe ya na-agaghị eme agaghị agbanwe.
10 “Ma, ọ bụrụ na nwaanyị nke nọ n’ụlọ di ya* ekwe nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi na e nwere ihe ya na-agaghị eme, 11 di ya ewee nụ ya, ma ọ kagbughị ihe ahụ nwunye ya kwuru, o kwughịkwa na nwunye ya agaghị eme ihe ahụ, nkwa niile nwaanyị ahụ kwere ma ọ bụ iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na e nwere ihe ya na-agaghị eme agaghị agbanwe. 12 Ma ọ bụrụ na n’ụbọchị di ya nụrụ ihe ahụ o kwuru, na ọ kagburu nkwa ọ bụla nwunye ya kwere ma ọ bụ iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na e nwere ihe ya na-agaghị eme, nkwa ahụ ma ọ bụ iyi ahụ agaghịzi enwe isi.+ Di ya akagbuola ya, Jehova ga-agbagharakwa nwaanyị ahụ. 13 Ọ bụ di ya ga-ekwu ma nkwa ọ bụla o kwere ma ọ bụ iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na ya agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya ọ̀ ga-enwe isi ma ọ bụ na ọ gaghị enwe isi. 14 Ma ọ bụrụ na ka ụbọchị na-aga, na di ya ekwughị na nwunye ya agaghị emezu nkwa ahụ, o kwetala ka nwunye ya mezuo nkwa niile o kwere ma ọ bụ iyi niile ọ ṅụrụ na e nwere ihe ọ na-agaghị eme. Otú o si kweta bụ na n’ụbọchị ọ nụrụ ihe nwunye ya kwuru, o kwughị na nwunye ya agaghị eme ihe ahụ. 15 Ma ọ bụrụ na di ya mechara kagbuo ihe nwunye ya kwuru mgbe ụbọchị ọ nụrụ ihe nwunye ya kwuru gaferela, ọ ga-eburu nsogbu ga-esi ná mmehie nwaanyị ahụ pụta.+
16 “Ihe ndị a bụ iwu Jehova nyere Mosis gbasara di na nwunye nakwa gbasara nna na nwa ya nwaanyị, bụ́ nwa agbọghọ ya na ya bi n’ụlọ.”