Levitikọs
2 “‘Ọ bụrụ na mmadụ* chọrọ ịchụrụ Jehova àjà ọka,+ àjà ya kwesịrị ịbụ ntụ ọka e gwere nke ọma. Ọ ga-awụ mmanụ n’elu ya ma tụkwasị frankinsens n’elu ya.+ 2 Ọ ga-ebuteziri ya ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekporo ntụ ọka e gwere nke ọma ga-eju ọbụ aka ya nakwa mmanụ na frankinsens ya niile, ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà+ e wetara. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. 3 Ihe ọ bụla fọrọ n’àjà ọka ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya.+ Ọ bụ ihe kacha nsọ+ si n’àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova.
4 “‘Ọ bụrụ na ị ga-eji achịcha e mere n’ekwú chụọ àjà ọka, ọ ga-abụ achịcha e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, ya bụ, ogbe achịcha ndị na-ekoghị eko dị okirikiri a gwara mmanụ ma ọ bụ achịcha ndị na-ekoghị eko dị fere fere a wụrụ mmanụ.+
5 “‘Ọ bụrụ na achịcha ị ga-eji chụọ àjà ọka bụ nke e mere n’ite dị mbadamba,+ ọ ga-abụ achịcha na-ekoghị eko e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, nke a gwara mmanụ. 6 A ga-anyawasị ya iberibe iberibe, ị ga-awụsakwa ya mmanụ.+ Ọ bụ àjà ọka.
7 “‘Ọ bụrụ na achịcha ị ga-eji chụọ àjà ọka bụ nke e mere n’ite e ji eme achịcha, ọ ga-abụ achịcha e ji ntụ ọka e gwere nke ọma na mmanụ mee. 8 Ị ga-ewetara Jehova àjà ọka e ji ihe ndị a mee. A ga-enyekwa ya onye nchụàjà, onye ga-eweta ya nso n’ebe ịchụàjà. 9 Onye nchụàjà ga-ewere ụfọdụ n’ime àjà ọka ahụ ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà+ e wetara. Ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.+ 10 Ihe fọrọ n’àjà ọka ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ ihe kacha nsọ si n’àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova.+
11 “‘E nweghị àjà ọka unu ga-achụrụ Jehova a ga-etinye ihe na-eko achịcha,+ n’ihi na unu agaghị eji ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha ma ọ bụ mmanụ aṅụ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ.
12 “‘Unu nwere ike iwetara ha Jehova ka mkpụrụ mbụ,+ ma a gaghị eweta ha n’ebe ịchụàjà ka e jiri ha chụọ àjà na-esi ísì ọma.*
13 “‘Ị ga-etinye nnu n’àjà ọka gị ọ bụla. Ekwela ka nnu ọgbụgba ndụ Chineke gị kọọ ụkọ n’àjà ọka gị. Ị ga-eweta nnu+ mgbe ọ bụla ị na-eweta ihe ị ga-eji chụọ àjà.
14 “‘Ọ bụrụ na ị ga-esi ná mkpụrụ mbụ kara aka wetara Jehova àjà ọka, ị ga-eweta ọka ọhụrụ* e ghere eghe,* mkpụrụ ọka ọhụrụ a na-egwerighị nke ọma, ka ọ bụrụ àjà ọka si ná mkpụrụ mbụ gị kara aka.+ 15 Ị ga-awụ mmanụ n’elu ya ma tụkwasị frankinsens n’elu ya. Ọ bụ àjà ọka. 16 Onye nchụàjà ga-esu ya ọkụ ka ọ bụrụ ihe na-anọchi anya àjà+ e wetara, ya bụ, ụfọdụ n’ime ọka ahụ a na-egwerighị nke ọma na mmanụ na frankinsens ya niile. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.