Abụ Ọma
AKWỤKWỌ NKE ATỌ
(Abụ Ọma 73-89)
Abụ Esaf.+
73 N’eziokwu, Chineke na-emere Izrel ihe ọma. Ọ na-emere ya ndị obi ha dị ọcha.+
2 Ma, ọ fọrọ obere ka m kpafuo.
Ọ fọrọ obere ka ụkwụ m mịchapụ.+
3 N’ihi na m malitere imere ndị ajọ omume, bụ́ ndị onwe ha na-ebu isi,* anyaụfụ
Mgbe m hụrụ na ihe na-agaziri ha.+
4 N’ihi na ahụ́ na-adị ha mma.*
Ha anaghị ahụsi anya mgbe ha na-anwụ.+
6 N’ihi ya, mpako bụ ihe olu ha.+
Ha yi tigbuo zọgbuo ka uwe.
7 Akụ̀* ha na-eme ka anya ha zaa.
Ihe na-agaziri ha karịa otú ha chere n’obi ha.
8 Ha na-achị ndị ọzọ ọchị, na-ekwukwa ihe ọjọọ.+
Ha na-etu ọnụ na ha ga-emesi ndị ọzọ ike.+
9 Ha na-ekwu okwu ka à ga-asị na isi ha na-eru n’eluigwe.
Ha na-ejegharị n’ụwa, na-ekwu ihe ọ bụla masịrị ha.
11 Ha na-asị: “Olee otú Chineke ga-esi mara?+
Onye Kacha Elu ọ̀ ma ihe na-eme?”
12 Ọ bụ ndị a bụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ha anaghị enwe nsogbu ọ bụla.+
Ha na-eme ka akụ̀ ha na-adịkwu ọtụtụ.+
13 N’eziokwu, mbọ m gbara mee ka obi m dị ọcha bụ n’efu.
Ọ bụkwa n’efu ka m kwọrọ aka m iji gosi na aka m dị ọcha.+
14 A na-enye m nsogbu ụbọchị niile.+
A na-ata m ahụhụ kwa ụtụtụ.+
15 Ma, a sị na m kwuru ihe ndị a,
Ọ pụtara na mụ aghọgbuola ndị gị.
16 Mgbe m gbara mbọ ka m ghọta ya,
Ọ nọ na-enye m nsogbu n’obi
17 Ruo mgbe m batara n’ebe nsọ dị ebube nke Chineke,
M wee ghọta ihe ga-eme ha n’ọdịnihu.
18 N’eziokwu, ọ bụ n’ala na-amị amị ka i dowere ha.+
Ị na-eme ka ha daa laa n’iyi.+
Ha na-ala n’iyi n’egbughị oge.
20 Jehova, ị ga-echefu ha mgbe i biliri,
Otú mmadụ si echefu nrọ mgbe o tetara n’ụra.
M yiri anụ ọhịa na-amaghị ihe n’anya gị.
23 Ma ugbu a, mụ na gị na-anọ mgbe niile.
I jidela m aka n’aka nri m.+
25 Ènwere m onye ọzọ n’eluigwe?
Ebe ọ bụ na m nwere gị, e nweghị ihe ọzọ m chọrọ n’ụwa.+
26 Ike nwere ike ịgwụ m, obi nwekwara ike ịda m mbà,
Ma, Chineke bụ oké nkume m nke na-eme ka obi sie m ike, bụrụkwa òkè m ruo mgbe ebighị ebi.+
27 N’eziokwu, a ga-ala ndị na-agbara gị ọsọ n’iyi.
Ị ga-ebibi onye ọ bụla kpara àgwà ka akwụna wee hapụ gị.+
28 Ma, ịbịa Chineke nso dị m mma.+
Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba m,
Ka m wee kọsaa ọrụ ya niile.+