Ọpụpụ
21 “Ihe ndị a bụ ihe ndị m kpebiri ị ga-agwa ha:+
2 “Ọ bụrụ na ị zụta onye Hibru ka ọ bụrụ ohu gị,+ ọ ga-abụ ohu ruo afọ isii. Ma n’afọ nke asaa, ọ ga-enwere onwe ya n’akwụghị gị ụgwọ ọ bụla.+ 3 Ọ bụrụ na ọ bịara naanị ya, ọ bụ naanị ya ga-ala. Ọ bụrụ na ọ kpọ nwaanyị bịa, ya na nwunye ya ga-eso laa. 4 Ọ bụrụ na nna ya ukwu lụnyere ya nwaanyị, ya amụọrọ ya ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị, nwunye ya na ụmụ ya ga-abụ nke nna ya ukwu, naanị ya ga-ala.+ 5 Ma ọ bụrụ na ohu ahụ ekweghị ala, wee sị, ‘Ahụrụ m nna m ukwu na nwunye m na ụmụ m n’anya. Achọghị m inwere onwe m,’+ 6 nna ya ukwu ga-akpọta ya n’ihu ezi Chineke. Ọ ga-akpọrọ ya gaa n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ n’awara ụzọ ma jiri ihe e ji akpọpu ntị kpọpuo ya ntị. Ọ ga-abụzi ohu ya ná ndụ ya niile.
7 “Ọ bụrụ na nwoke eree nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ ohu, ọ bụghị otú nwoke bụ́ ohu si ala ka ọ ga-esi ala ma o nwere onwe ya. 8 Ọ bụrụ na nwaanyị ahụ adịghị nna ya ukwu mma, nna ya ukwu ejighịkwa ya mere iko nwaanyị, kama ya ekpebie iresị ya onye ọzọ,* ọ gaghị eresị ya ndị mba ọzọ n’ihi na ọ ghọrọ nwaanyị ahụ aghụghọ. 9 Ọ bụrụ na ọ kpọnye ya nwa ya nwoke, ọ ga-emere ya ihe mmadụ na-emere nwa ya nwaanyị. 10 Ọ bụrụ na ọ lụọ nwaanyị ọzọ, ọ ga na-enye nwunye mbụ ya ihe oriri, ákwà, na ihe ruuru ya*+ otú o kwesịrị. 11 Ọ bụrụ na ọ gaghị emere nwaanyị ahụ ihe atọ a, nwaanyị ahụ ga-ala n’akwụghị ya ego ọ bụla.
12 “A ga-egbu onye ọ bụla kụgburu mmadụ.+ 13 Ma ọ bụrụ na ọ maghị ụma gbuo onye ahụ, ezi Chineke ekwe ka ihe a mee, m ga-ahọpụtara unu ebe o nwere ike ịgbaga.+ 14 Ọ bụrụ na mmadụ ewesa mmadụ ibe ya oké iwe ma mara ụma gbuo ya,+ a ga-egbu ya. Ọ bụrụgodị na ọ gbagara n’ebe ịchụàjà m, unu ga-akpọpụta ya ma gbuo ya.+ 15 A ga-egbu onye tiri nne ya ma ọ bụ nna ya ihe.+
16 “Ọ bụrụ na mmadụ atọrọ mmadụ+ ree ma ọ bụ a chọta onye ahụ n’aka ya,+ a ga-egbu ya.+
17 “Onye ọ bụla kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi,* a ga-egbu ya.+
18 “Ihe a bụ ihe unu ga-eme ma ọ bụrụ na ụmụ nwoke na-ese okwu, otu atụọ ibe ya nkume ma ọ bụ kụọ ya ọkpọ* wee merụọ ya ahụ́, ma ọ nwụghị, kama ọ naghị ebiliteli n’àkwà* ya: 19 Ọ bụrụ na o bilie jiri mkpara gagharịwa n’èzí, a gaghị ata onye ahụ tụrụ ya nkume ma ọ bụ kụọ ya ọkpọ ahụhụ. Naanị na ọ ga-akwụ onye ahụ o merụrụ ahụ́ ụgwọ maka oge niile ọ na-arụghị ọrụ ruo mgbe ọ gbakechara.
20 “Ọ bụrụ na mmadụ akụọ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị osisi, kụgbuo ya, a ga-ata ya ahụhụ.+ 21 Ma ọ bụrụ na ohu ahụ anwụghị ruo otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ, a gaghị ata onye nwe ya ahụhụ n’ihi na ọ bụ ego ya ka o ji zụọ ya.
22 “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-alụ ọgụ, ha emerụọ nwaanyị dị ime ahụ́, ya amụọ nwa mgbe oge ya na-erubeghị,*+ ma e nweghị onye nwụrụ,* onye ahụ merụrụ nwaanyị ahụ ahụ́ ga-akwụ ihe ọ bụla di ya gwara ya kwụọ. Ọ ga-abụkwa ihe ndị ikpe kpebiri.+ 23 Ma ọ bụrụ na e nwee onye nwụrụ,* a ga-egbu onye ahụ gburu mmadụ.*+ 24 Onye kụkpọrọ mmadụ anya, a ga-akụkpọ ya anya. Onye kụpụrụ mmadụ ezé, a ga-akụpụ ya ezé. Onye gbajiri mmadụ aka, a ga-agbaji ya aka. Onye gbajiri mmadụ ụkwụ, a ga-agbaji ya ụkwụ.+ 25 Onye dara mmadụ ọkụ, a ga-ada ya ọkụ. Onye merụrụ mmadụ ahụ́, a ga-emerụ ya ahụ́. Onye kụrụ mmadụ ọkpọ, a ga-akụ ya ọkpọ.
26 “Ọ bụrụ na mmadụ akụọ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ihe n’anya, kụkpọọ ya anya, ọ ga-ahapụ ohu ya ahụ ka ọ lawa iji kwụọ ya ụgwọ maka anya ya.+ 27 Ọ bụrụ na ọ kụpụrụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ezé, ọ ga-ahapụ ohu ya ahụ ka ọ lawa iji kwụọ ya ụgwọ maka ezé ya.
28 “Ọ bụrụ na ehi asọọ nwoke ma ọ bụ nwaanyị mpi, onye ahụ anwụọ, a ga-eji nkume tụgbuo ehi ahụ,+ a gaghịkwa eri anụ ya eri. Ma a gaghị ata onye nwe ehi ahụ ahụhụ. 29 Ma ọ bụrụ na ehi ahụ na-asọbu ndị mmadụ mpi, ya abụrụkwa na a dọọla onye nwe ya aka ná ntị, ma o jideghị ehi ahụ, ehi ahụ egbuo nwoke ma ọ bụ nwaanyị, a ga-eji nkume tụgbuo ehi ahụ, gbuokwa onye nwe ya. 30 Ọ bụrụ na a gwa ya ihe ọ ga-akwụ ka ọ gbara isi ya, ọ ga-akwụ ihe niile a gwara ya kwụọ ka ọ bụrụ ihe o ji gbapụta ndụ* ya. 31 Ma ọ̀ bụ nwa nwoke ma ọ̀ bụ nwa nwaanyị ka ehi ahụ sọrọ mpi, a ga-eme onye nwe ya ihe a m kpebiri. 32 Ọ bụrụ ohu nwoke ma ọ bụ ohu nwaanyị ka ehi ahụ sọrọ mpi, onye nwe ehi ahụ ga-akwụ nna ukwu ohu ahụ shekel* iri atọ. A ga-ejizi nkume tụgbuo ehi ahụ.
33 “Ọ bụrụ na mmadụ emeghee olulu ma ọ bụ gwuo olulu, ma o kpuchighị ya ihe, ehi ma ọ bụ jakị adaba n’ime ya, 34 onye nwe olulu ahụ ga-akwụ ụgwọ ya.+ Ọ ga-akwụ onye nwe anụ ahụ ego ole anụ ahụ ruru. Anụ ahụ nwụrụ anwụ ga-abụzi nke ya. 35 Ọ bụrụ na ehi mmadụ emerụọ ehi onye ọzọ ahụ́, ehi ahụ anwụọ, ha ga-ere ehi ahụ dị ndụ, kee ego e retere ya. Ha ga-ekekwa anụ ahụ nwụrụ anwụ. 36 Ma ọ bụ, ọ bụrụ na e nwere ehi a ma na ọ na-asọ anụmanụ ndị ọzọ mpi, ma onye nwe ya ejideghị ya, onye nwe ya ga-akwụ ụgwọ anụmanụ ọ sọgburu. Ọ ga-eji ehi kwụọ ụgwọ ehi. Nke ahụ nwụrụ anwụ ga-abụzi nke ya.