Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 6
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • Mmadụ ikwe nkwa na ọ ga-abụ onye Naziraịt (1-21)

      • Otú ndị nchụàjà ga-esi na-agọzi ndị Izrel (22-27)

Ọnụ Ọgụgụ 6:2

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Hibru na·zir′. Ọ pụtara “Onye E Wepụtara Iche; Onye E Nyefere Chineke.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ikp 13:5

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, p. 1896

Ọnụ Ọgụgụ 6:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 10:9; Em 2:11, 12; Lu 1:15

Ọnụ Ọgụgụ 6:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ikp 13:5; 16:17; 1Sa 1:11

Ọnụ Ọgụgụ 6:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ọnụ Ọgụgụ 6:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 21:1, 11

Ọnụ Ọgụgụ 6:9

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “merụọ isi o ji bụrụ onye Naziraịt.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 19:14
  • +Ọg 6:13, 18

Ọnụ Ọgụgụ 6:11

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

  • *

    O nwere ike ịbụ na otú ọ ga-esi eme ya bụ ịhapụ ntutu isi ya ka o bidokwa towe.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 5:8, 10

Ọnụ Ọgụgụ 6:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 30:2; Ek 5:4

Ọnụ Ọgụgụ 6:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 1:10
  • +Le 4:32
  • +Le 3:1

Ọnụ Ọgụgụ 6:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 2:1; 6:14
  • +Ọg 15:8, 10

Ọnụ Ọgụgụ 6:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 2:9

Ọnụ Ọgụgụ 6:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “isi o ji bụrụ onye Naziraịt.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 6:5

Ọnụ Ọgụgụ 6:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 8:31

Ọnụ Ọgụgụ 6:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 29:23, 24
  • +Le 7:34

Ọnụ Ọgụgụ 6:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ikp 13:5

Ọnụ Ọgụgụ 6:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 9:22; Di 10:8

Ọnụ Ọgụgụ 6:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ru 2:4; Ọm 134:3

Ọnụ Ọgụgụ 6:25

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Ka Jehova mee ka ihu ya nwuoro unu ìhè.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 31:16; 67:1

Ọnụ Ọgụgụ 6:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 29:11; Lu 2:14

Ọnụ Ọgụgụ 6:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 28:10; Aịz 43:7, 10
  • +Ọm 5:12; 67:7

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 6:2Ikp 13:5
Ọnụ Ọgụ. 6:3Le 10:9; Em 2:11, 12; Lu 1:15
Ọnụ Ọgụ. 6:5Ikp 13:5; 16:17; 1Sa 1:11
Ọnụ Ọgụ. 6:7Le 21:1, 11
Ọnụ Ọgụ. 6:9Ọg 19:14
Ọnụ Ọgụ. 6:9Ọg 6:13, 18
Ọnụ Ọgụ. 6:11Le 5:8, 10
Ọnụ Ọgụ. 6:13Ọg 30:2; Ek 5:4
Ọnụ Ọgụ. 6:14Le 1:10
Ọnụ Ọgụ. 6:14Le 4:32
Ọnụ Ọgụ. 6:14Le 3:1
Ọnụ Ọgụ. 6:15Le 2:1; 6:14
Ọnụ Ọgụ. 6:15Ọg 15:8, 10
Ọnụ Ọgụ. 6:17Le 2:9
Ọnụ Ọgụ. 6:18Ọg 6:5
Ọnụ Ọgụ. 6:19Le 8:31
Ọnụ Ọgụ. 6:20Ọp 29:23, 24
Ọnụ Ọgụ. 6:20Le 7:34
Ọnụ Ọgụ. 6:21Ikp 13:5
Ọnụ Ọgụ. 6:23Le 9:22; Di 10:8
Ọnụ Ọgụ. 6:24Ru 2:4; Ọm 134:3
Ọnụ Ọgụ. 6:25Ọm 31:16; 67:1
Ọnụ Ọgụ. 6:26Ọm 29:11; Lu 2:14
Ọnụ Ọgụ. 6:27Di 28:10; Aịz 43:7, 10
Ọnụ Ọgụ. 6:27Ọm 5:12; 67:7
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 6:1-27

Ọnụ Ọgụgụ

6 Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị: 2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ekwe nkwa pụrụ iche na ọ ga-abụ onye Naziraịt*+ nke Jehova, 3 ọ gaghị na-aṅụ mmanya na ihe ọ bụla na-aba n’anya. Ọ gaghị aṅụ mmanya gbara ụka ma ọ bụ ihe na-aba n’anya gbara ụka.+ Ọ gaghị aṅụ ihe ọ bụla a na-aṅụ aṅụ e ji mkpụrụ vaịn mee. Ọ gaghịkwa ata mkpụrụ vaịn, ma nke ndụ ma nke a mịkpọrọ amịkpọ. 4 N’oge niile ọ bụ onye Naziraịt, ọ gaghị eri ihe ọ bụla e ji mkpụrụ vaịn mee, ma mkpụrụ vaịn na-achaghị acha ma mkpo ya.

5 “‘N’oge niile o kwere nkwa na ya ga-abụ onye Naziraịt, agụba agaghị emetụ ya n’isi.+ Ọ ga-adị nsọ. Otú ọ ga-esi dị nsọ bụ na ọ ga-ahapụ ntutu isi ya ka ọ na-eto ruo mgbe oge o nyefere Jehova onwe ya zuru. 6 Ọ gaghị abịa onye nwụrụ anwụ* nso n’oge niile o nyefere Jehova onwe ya. 7 Ọ bụrụgodị na nna ya ma ọ bụ nne ya ma ọ bụ nwanne ya nwoke ma ọ bụ nwanne ya nwaanyị anwụọ, ọ gaghị emerụ onwe ya,+ n’ihi na ihe na-egosi na ọ bụ onye Naziraịt nke Chineke ya dị n’isi ya.

8 “‘Ọ bụụrụ Jehova onye dị nsọ n’oge niile ọ bụ onye Naziraịt. 9 Ma ọ bụrụ na mmadụ nọ n’akụkụ ya nwụọ na mberede, ahụ́ ya emetụ ya,+ o wee merụọ ntutu isi ya nke na-egosi na ọ bụ onye e wepụtara iche maka Chineke,* ọ ga-akpụ isi ya+ n’ụbọchị a ga-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-akpụ ya n’ụbọchị nke asaa. 10 N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewetara onye nchụàjà nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 11 Onye nchụàjà ga-eji otu chụọ àjà mmehie, jiri nke ọzọ chụọ àjà a na-esu ọkụ ka e jiri kpuchiere ya mmehie o mere+ n’ihi onye nwụrụ anwụ.* Ọ ga-eme ka isi ya dị nsọ* n’ụbọchị ahụ. 12 Ọ ga-ewepụta onwe ya ọzọ ka ọ bụrụ onye Naziraịt nke Jehova n’oge niile ọ ga-abụ ya. Ọ ga-akpụta ebule na-agafebeghị otu afọ ka e jiri ya chụọ àjà ikpe ọmụma. Ma, a gaghị agụnye oge ndị gara aga n’ihi na o merụrụ onwe ya n’oge ọ bụ onye Naziraịt.

13 “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị onye Naziraịt: Mgbe ọ nọzuru oge o ji bụrụ onye Naziraịt,+ a ga-akpọta ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 14 N’ebe ahụ ka ọ ga-enye Jehova onyinye ya, ya bụ, ebule ahụ́ dị mma nke na-agafebeghị otu afọ ka e jiri ya chụọ àjà a na-esu ọkụ,+ obere nne atụrụ ahụ́ dị mma na-agafebeghị otu afọ ka e jiri ya chụọ àjà mmehie,+ otu ebule ahụ́ dị mma ka e jiri ya chụọ àjà udo,+ 15 otu nkata achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, nke a gwara mmanụ, achịcha ndị na-ekoghị eko dị fere fere a wụrụ mmanụ, nakwa àjà ọka+ na àjà mmanya+ ha na ha na-agakọ. 16 Onye nchụàjà ga-eche ihe ndị a n’ihu Jehova ma chụọ àjà mmehie na àjà a na-esu ọkụ maka onye ahụ. 17 Ọ ga-eji ebule ahụ chụọrọ Jehova àjà udo, ya na achịcha ndị ahụ na-ekoghị eko dị na nkata. Onye nchụàjà ga-achụkwa àjà ọka+ na àjà mmanya ha na ha na-agakọ.

18 “‘Onye Naziraịt ahụ ga-akpụ ntutu isi ya*+ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Ọ ga-ekporo ntutu isi ya nke toro n’oge ọ bụ onye Naziraịt wụnye n’ọkụ na-ere anụ ahụ e ji chụọ àjà udo. 19 Onye nchụàjà ga-ewere otu ubu ebule ahụ e siri esi,+ si n’ime nkata ahụ were otu achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri na otu achịcha na-ekoghị eko dị fere fere. Ọ ga-achịkwasị ha n’ọbụ aka abụọ onye Naziraịt ahụ mgbe ọ kpụcharala isi na-egosi na ọ bụ onye Naziraịt. 20 Onye nchụàjà ga-efegharị ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova.+ Ọ bụ ihe dị nsọ a ga-enye onye nchụàjà, ya na okpuru afọ* anụ e ji chụọ àjà e fegharịrị efegharị na ụkwụ anụ ahụ e nyere n’onyinye.+ E mechaa, onye Naziraịt ahụ nwere ike ịṅụ mmanya.

21 “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị onye Naziraịt+ nke kwere nkwa: Ọ bụrụ na o kwere nkwa na e nwere ihe ọzọ ọ ga-enye Jehova ma e wepụ ihe ndị onye Naziraịt kwesịrị iweta, ya abụrụkwa na ọ ga-ewetali ya, ọ ga-emezu nkwa ya n’ihi na o ji iwu na-achị ndị Naziraịt kpọrọ ihe.’”

22 Jehova gwaziri Mosis, sị: 23 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, sị, ‘Otú a ka unu ga-esi na-agọzi+ ndị Izrel. Na-asịnụ ha:

24 “Ka Jehova gọzie unu+ ma chebe unu.

25 Ka Jehova nwee mmasị n’ebe unu nọ,*+ ka o meekwara unu amara.

26 Ka Jehova meere unu ihe ọma, meekwa ka udo dịrị unu.”’+

27 Ha ga-eji aha m gọzie ndị Izrel,+ ka m wee gọzie ha.”+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya