Job
20 Zofa+ onye Neama kwuru, sị:
2 “Obi ezughị m ike, obi erughịkwa m ala.
Ọ bụ ya mere m ji chọọ ikwu okwu.
3 Anụla m mba a baara m, nke e ji kparịa m.
Ihe m ghọtara na-emekwa ka m saa gị okwu.
4 O doro anya na ị ma ihe a kemgbe,
N’ihi na ọ dị otú a kemgbe e kere mmadụ,*+
5 Na mkpu ọṅụ ndị ajọ omume na-eti anaghị adịte aka,
Nakwa na ọ bụ naanị obere oge ka onye na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-aṅụrị ọṅụ.+
6 Ọ bụrụgodị na mpako ya ruru n’eluigwe,
Isi ya ana-emetụkwa n’ígwé ojii,
7 Ọ ga-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi otú nsị ya si ala n’iyi.
Ndị na-ahụbu ya ga-asị, ‘Olee ebe ọ nọ?’
8 A ga-echefu ya otú e si echefu nrọ.
A ga-echefu ya otú e si echefu ọhụụ a hụrụ n’abalị.
10 Ụmụ ya ga-arịọ ndị ogbenye ka ha meere ha amara,
Ọ ga-ejikwa aka ya nyeghachi ndị ọzọ akụ̀ ọ naara ha.+
11 Ike okorobịa juru ya ahụ́,
Ma ike ka ga-eju ya n’ahụ́ ya anwụọ.
12 Ọ bụrụ na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ n’ọnụ,
Ọ bụrụ na o zoo ya n’okpuru ire ya,
13 Ọ bụrụ na ọ kpụrụ ya n’ọnụ ya,
Ya ana-atọ ya ụtọ, ọ chọghịkwa ilo ya ngwa ngwa,
14 Nri ahụ ga-agba ụka n’ime afọ ya.
Ọ ga-adị ka elò agwọ ubí n’ime ahụ́ ya.
15 O loola akụnụba, ma ọ ga-agbọpụta ya.
Chineke ga-eme ka o si n’afọ ya pụta.
16 Ọ ga-amịrị elò agwọ ubí.
Ajụala ga-eji ezé ya tagbuo ya.*
17 Ọ gaghị ahụ mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi,
Bụ́ ndị na-asọ ka iyi.
18 Ọ ga-eweghachi akụ̀ ọ kpatara, n’erighị ya eri.
Ọ gaghị eri akụ̀ ọ na-akpata n’ahịa ọ na-azụ.+
19 N’ihi na o chiela ndị ogbenye ọnụ n’ala, gbahapụkwa ha.
O werela ụlọ ọ na-abụghị ya rụrụ.
20 Ma obi agaghị ezu ya ike.
Akụnụba ya agaghị azọpụta ya.
21 E nweghị ihe ọ ga-anapụ mmadụ.
Ọ bụ ya mere na ihe agaghị anọ na-agara ya nke ọma.
22 Mgbe akụnụba ya ga-eju ebe niile, ọ ga-echegbuwe onwe ya.
Ihe ọjọọ niile ga-abịara ya.
23 Mgbe ọ na-eri ihe ka o rijuo afọ,
Chineke* ga-ewesa ya ezigbo iwe,
Mee ka iwe ya zuo ya ahụ́ ka ebe mmiri mazuru mmadụ ahụ́.
24 Mgbe ọ na-agbapụ ka ngwá agha ndị e ji ígwè rụọ ghara imerụ ya ahụ́,
Ụta e ji ọla kọpa rụọ ga-agbapu ya ahụ́.
Ụjọ na-ejide ya.+
26 A ga-awụfu akụnụba ya niile n’ebe gbara oké ọchịchịrị.
Ọkụ a na-enweghị onye fụnwuru ya ga-eregbu ya.
Ọdachi ga-abịara onye ọ bụla fọrọ ndụ n’ụlọikwuu ya.
27 Eluigwe ga-ekpughe mmehie ya.
Ụwa ga-emegide ya.
28 Idei mmiri ga-ebupụ ụlọ ya.
Mmiri ga-ezosi ike n’ụbọchị iwe Chineke.*
29 Ọ bụ ihe a ka onye ajọ omume ga-eketa n’aka Chineke.
Ọ bụ ihe Chineke kwuru na a ga-ekenye ya.”