Job
20 Zofa onye Neama wee zaa, sị:
2 “Ọ bụ ya mere obi m nke na-ezughị ike ji na-azaghachi m,
Ọbụna n’ihi nchegbu m na-enwe.
3 Ihe m na-anụ bụ ndụmọdụ mkparị;
Mmụọ nke na-aza m bụ mmụọ nke na-enweghị nghọta m nwere.
4 Ị̀ maara nke a site ná mmalite,
Kemgbe e mere ka mmadụ nọrọ n’elu ụwa,+
5 Na mkpu ọṅụ nke ndị ajọ omume na-adịru nwa oge,+
Nakwa na ọṅụ nke onye si n’ezi ofufe dapụ na-adịru naanị otu ntabi anya?
6 Ọ bụrụgodị na ebube ya eruo n’eluigwe,+
Isi ya emetụkwa n’ígwé ojii,
7 Ọ ga-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi dị ka nsị ya;+
Ndị na-ahụ ya ga-asị, ‘Olee ebe ọ nọ?’+
10 Ụmụ ya ga-arịọ ka ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha meere ha amara,
Ọ ga-ejikwa aka ya nyeghachi ndị ọzọ akụ̀ ha.+
12 Ọ bụrụ na ihe ọjọọ atọọ ya ụtọ n’ọnụ,
Ọ bụrụ na o mee ka ọ gbarie n’okpuru ire ya,
13 Ọ bụrụ na ọ na-atọ ya ụtọ nke na ọ hapụghị ya,
Ọ bụrụkwa na ọ kpụgidesie ya ike n’ọnụ,
14 A ga-agbanwe nri ya n’ime eriri afọ ya;
Ọ ga-aghọ elò agwọ ubí n’ime ya.
15 O lodawo akụ̀, ma ọ ga-agbọpụta ya;
Chineke ga-eme ka o si n’afọ ya pụta.
18 Ọ ga-eweghachi akụ̀ ọ kpatara, ọ gaghị eri ya;
Dị ka akụ̀ ọ kpatara n’azụmahịa ya, nke ọ na-agaghị eri.+
19 N’ihi na o gwepịawo ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, ọ gbahapụwo ha;
Ọ napụwo mmadụ ụlọ ọ na-abụghị ya wuru.+
21 E nweghị ihe fọdụụrụ ya ọ ga-eripịa;
Ọ bụ ya mere na ihe ịga nke ọma ya agaghị adịgide.
22 Ọ ga na-enwe nchegbu ọbụna mgbe akụ̀ ya juru ebe niile;+
Ihe ndabara ọjọọ ga-eji ike ya dum bịakwasị ya.
23 Ka ọ bụrụ na, iji mee ka afọ ju ya,
Chineke ga-eweso ya iwe dị ọkụ,+
Ọ ga-emekwa ka o zokwasị ya, banye ya n’afọ.
25 A ga-agba ya akụ́ ụta, o wee si ya n’azụ pụta,
Ngwá ọgụ nke na-egbu maramara ga-agbapukwa akpa ilu ya;+
Ihe ndị na-emenye ụjọ ga-abịakwasị ya.+