Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 9/8 p. 32
  • Ọdịnihu Dị Ebube Maka Mbara Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọdịnihu Dị Ebube Maka Mbara Ụwa
  • Teta!—1996
Teta!—1996
g96 9/8 p. 32

Ọdịnihu Dị Ebube Maka Mbara Ụwa

“NCHỌPỤTA na-egosi na Ụwa nọ ugbu a n’ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ kasị ukwuu o nwetụrụla n’afọ 600,” ka akwụkwọ akụkọ Toronto bụ́ The Globe and Mail na-akọ. Na 1995 ụzarị okpomọkụ mere n’etiti United States gburu ihe karịrị mmadụ 500 na Chicago. Ọnọdụ ndị dị otú ahụ gabigara ókè dakwasịrị India na Australia, ebe England nwere “oge okpomọkụ nke atọ kasị ukwuu n’ime afọ 200.”

Gịnị na-akpata nke a? Henry Hengeveld, bụ́ ọkachamara ná mmụta ihu igwe, nke na-arụ ná Ngalaba Gburugburu Ebe Obibi mba na Canada na-ekwu, sị: “Ihe àmà ka ukwuu na-egosi na e nwere mmetụta a pụrụ ịhụ anya nke ụmụ mmadụ n’ọnọdụ ihu igwe nke ụwa dum.” Dị ka akụkọ The Globe and Mail ahụ si kwuo, “ọnọdụ ihu igwe ahụ pụrụ iche kwekọrọ n’ụdị kọmputa ndị na-eṅomi mmetụta ikpo ọkụ nke ụwa, bụ́ nke e chere na ihe bụ isi na-akpata ya bụ nrechapụ nke mmanụ ọkụ e gwutere n’ala.”

Ịdị adị nke ikpo ọkụ nke ụwa ka bụ ihe a na-arụ ụka n’etiti ndị ọkà mmụta sayensị. Ka o sina dị, akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ihe a kpọrọ mmadụ na-emetọ gburugburu mbara ikuku ngwa ngwa karịa otú ọ na-aghọta ya.”

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Bible na-agwa anyị na ụwa “na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi.” (Eklisiastis 1:4) Nke a bụ n’ihi na Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke, agaghị ekwe ka mmadụ ma ọ bụ ikike ọ bụla ọzọ sitere n’okike bibie ya. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’—Mkpughe 11:17, 18.

Tụkwasị na nke ahụ, Bible na-emesi anyị obi ike na Jehova Chineke akwadebewo ọdịnihu dị ebube maka mbara ala anyị, bụ́ Ụwa, na ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi. “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” Lee obi ụtọ anyị pụrụ inwe na ọdịnihu ụwa dị n’aka Chineke, ọ bụghị n’aka mmadụ!—Abụ Ọma 37:11; 72:16; Aịsaịa 65:17-25; 2 Pita 3:13.

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịnata mbipụta Teta! ndị dị n’ihu, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ dega akwụkwọ n’adres dịkarịsịrị gị nso e depụtara na peji nke 5.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

NASA photo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya