Otu Ógbè Dị n’Elu Osisi Ndị E Gwunyere ná Mmiri
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Benin
“GANVIÉ bụ otu n’ime ebe ndị bụ isi na-adọrọ mmasị ndị na-eme njem nleta na Benin,” ka otu akwụkwọ nduzi ndị njem na-aga Ọdịda Anyanwụ Africa na-ekwu. Ọzọ na-ekwu, sị: “Ganvié na-amasị ndị Africa n’onwe ha; ị ga-ahụ ọtụtụ ndị Africa na-eme njem nleta dị ka ị ga-ahụ ndị ebe ọdịda anyanwụ ụwa.”
Ganvié pụrụ iche n’ezie. Ọ bụ obodo nta nwere mmadụ 15,000 bi n’ime ya, bụ́ nke e wuru n’elu osisi e gwunyere ná mmiri nke Ọdọ Mmiri Nokoué, n’ebe ugwu Cotonou, Benin. Na Ganvié, e nweghị ịnyịnya ígwè, e nweghị ụgbọala, e nweghị ụzọ ndị ji ụkwụ si agafe, e nweghị okporo ụzọ. Ọ bụrụ na ndị bi na ya achọọ ịga ụlọ akwụkwọ, ahịa, obere ụlọ ọgwụ ahụ ike, n’ụlọ onye agbata obi, ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ, ha na-abanye n’ime ụgbọ epeepe e ji osisi ọjị̀ tụọ.
Ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ nwere ọtụtụ ụgbọ epeepe—otu maka Nna, otu maka Nne, mgbe ụfọdụkwa otu maka ụmụntakịrị. Ụmụntakịrị na-amụta ịkwọ ụgbọ epeepe n’ezi oge. Mgbe ọ na-erule afọ ise, nwatakịrị pụrụ ịkwọ ụgbọ epeepe nanị ya. N’oge na-adịghị anya, ọ na-enwe obi ike zuru ezu ịkwụrụ ọtọ n’ụgbọ epeepe iji wụọ obere ụgbụ azụ̀. Ọ na-amasị ụfọdụ ndị na-eto eto imere ndị ọbịa ngala site n’iji isi eguzoro n’ime ụgbọ epeepe ha.
N’ahịa na-ese n’elu mmiri nke Ganvié, ndị ahịa, karịsịa ndị inyom, na-anọdụ ala n’ụgbọ epeepe ha, ha na ibu ha kwakọbara n’ihu ha—ihe e ji eme ka nri dị ụtọ, mkpụrụ osisi, azụ̀, ọgwụ, nkụ, biya, na ọbụna redio. N’iji okpu ahịhịa sara mbara kpuchie onwe ha pụọ n’anwụ nke ebe okpomọkụ, ha na-eresị ndị ọzọ kwọọrọ ụgbọ epeepe ha bịa ịzụ ahịa ihe. Mgbe ụfọdụ ndị na-ere ihe bụ ụmụ agbọghọ. Ekwela ka afọ ndụ ha duhie gị! Ha na-amụta n’ezi oge nkà ndị ahịa nke ịdị akọ n’ikwe ọnụ ahịa.
Ka ndị inyom na-azụ ma na-ere ihe n’ahịa, ndị ikom na-arụ ọrụ igbu azụ̀, ma ọ bụ ịzụ azụ̀ n’ikwu ya kpọmkwem. Ụzọ ha si ejide azụ̀ na-agụnye igwunye ọtụtụ narị alaka osisi n’ala mmiri apịtị ahụ, nke na-eme ka e nwee oké ọhịa osisi. Azụ̀ na-egwuru mmiri gaa iri alaka osisi ndị na-ere ure. Mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị ndị ikom ahụ na-eji ụgbụ ha laghachi ijide azụ̀ ndị ahụ.
Site n’Ebe Nzopụ Gaa n’Ebe Na-adọrọ Mmasị Ndị Bịara Njem Nleta
Ndị Toffinu nke Ganvié abụghị mgbe nile “Ndị Bi ná Mmiri,” dị ka a maara ha taa. Ná mmalite narị afọ nke 18, ha gbagara n’ọdọ mmiri na apịtị iji gbanarị mkpagbu site n’aka otu alaeze ndị Africa gbara ha agbata obi. Ndị ọkà mmụta na-ekwu na aha ahụ bụ́ Ganvié na-egosipụta akụkọ ihe mere eme nke a, ebe ọ bụ na n’asụsụ Toffin, a pụrụ ịsụgharị okwu ahụ bụ́ gan ịbụ “a zọpụtawo anyị” okwu ahụ bụ́ vie pụtakwara “ógbè.” Ya mere, a pụrụ ịsụgharị aha isi obodo a nke obodo ọdọ mmiri n’ụzọ dị mfe ịbụ “ógbè nke ndị mesịworo chọta udo.”
Ịchọta ebe mgbaba na gburugburu Ọdọ Mmiri Nokoué bụ atụmatụ dị irè, ebe ọ bụ na nkweta okpukpe nke alaeze na-emegide emegide ekweghị ka onye agha ọ bụla nwaa ịbanye n’ime mmiri ma ọ bụ ebe a pụrụ inwe idei mmiri. Ya mere ọdọ mmiri ahụ nyere ma ihe e ji ebi ndụ ma ebe nchebe pụọ n’aka ndị iro. Ọ bụ ihe na-agba gharịị na ógbè a a ma ama ugbu a, nke ọtụtụ ìgwè ndị na-eme njem nleta na-eji ụgbọ epeepe nwere injin eleta, bụbu ebe nzopụ.