Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 8/8 p. 23-25
  • Ọ̀ Dị Njọ Iri Anụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dị Njọ Iri Anụ?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Ụfọdụ Adịghị Eri Anụ
  • Ọ̀ Dị Njọ Igbu Ụmụ Anụmanụ?
  • Iji Ụmụ Anụmanụ Eme Nri
  • Igosi Nkwanye Ùgwù Maka Ndụ Anụmanụ
  • Inwe Ọmịiko n’Ebe Ụmụ Anụmanụ Nọ
  • Onye Kraịst Ò Kwesịrị Ịbụ Onye Na-eri Nanị Akwụkwọ Nri
  • Ụmụ Anụmanụ
    Teta!—2015
  • Ịrụsa Anụmanụ Arụrụala—Ọ̀ Dị Njọ?
    Teta!—1998
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ụmụ Anụmanụ Hà Na-aga Eluigwe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 8/8 p. 23-25

Echiche nke Bible

Ọ̀ Dị Njọ Iri Anụ?

“LEE, ENYEWO M UNU IHE ỌKỤKỤ NILE Ọ BULA NA-AMỊPỤTA MKPỤRỤ ỌGHỊGHA, NKE DỊ N’ELU ỤWA NILE, NA OSISI NILE Ọ BỤLA, NKE MKPỤRỤ OSISI NA-AMỊPỤTA MKPỤRỤ ỌGHỊGHA DỊ N’IME YA; UNU KA Ọ DỊỊRỊ ỊBỤ IHE ORIRI.”—Jenesis 1:29.

SUJATA dị afọ 18, nke sitere n’ezinụlọ Hindu na-eri nanị akwụkwọ nri, kwenyere ngwa ngwa ná ntụziaka ihe oriri Chineke nyere nwoke mbụ, bụ́ Adam. Ma ọ jụrụ ozugbo, sị: “Gịnịzi mere ndị mmadụ ji egbu anụmanụ iji mere nri mgbe e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ a ga-eri?”

Ọtụtụ ndị gbaa ụwa gburugburu na-ekwupụta echiche yiri ndị a. Ọtụtụ narị nde ndị bi n’Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-eri ihe oriri anụ na-adịghị na ya. Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ ndị na-eri nanị akwụkwọ nri n’Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-amụba. Na United States nanị, ihe dị ka nde 12.4 mmadụ na-azọrọ ịbụ ndị na-eri nanị akwụkwọ nri, nke ji ihe dị ka nde 3 karịa nke iri afọ gara aga.

N’ihi gịnị ka ọtụtụ ji ahọrọ ihe oriri anụ na-adịghị na ya? Gịnị bụ echiche ziri ezi banyere ndụ anụmanụ? Iri anụ ọ̀ na-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka ndụ? N’ihi ihe e kwuru na Jenesis 1:29, ọ̀ dị njọ iri anụ? Nke mbụ, tụlee ihe mere ụfọdụ adịghị eri anụ.

Gịnị Mere Ụfọdụ Adịghị Eri Anụ

Nye Sujata, ihe oriri ya metụtara nkwenkwe okpukpe ya. “Etolitere m dị ka onye Hindu, na-ekweta n’ozizi ịlọ ụwa,” ka ọ na-akọwa. “Ebe mkpụrụ obi mmadụ pụrụ ịlaghachite dị ka anụmanụ, m na-ewere ụmụ anụmanụ dị ka ndị mụ na ha hà nhata. Ya mere o yikwara ihe dị njọ igbu ha iji mere nri.” Okpukpe ndị ọzọ na-akwadokwa ihe oriri bụ nanị akwụkwọ nri.

Ihe ndị ụfọdụ ma e wezụga nkwenkwe okpukpe na-emetụtakwa ihe ndị mmadụ na-ahọrọ iri. Dị ka ihe atụ, Dr. Neal Barnard, kwuru hoo haa, sị: “Nanị ihe mere a ga-eji rie anụ bụ àgwà ma ọ bụ amaghị nke a na-akọ.” Nguzo ya siri ike dabere n’echiche ya banyere ihe ize ndụ ahụ ike nke iri anụ, dị ka ọrịa obi na ọrịa cancer.a

Na United States, e kwuru na ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ ìgwè kasị amụba ngwa ngwa ná ndị na-eri nanị akwụkwọ nri. Nchegbu banyere ụmụ anụmanụ bụkwa otu ihe kpatara ya. “Ụmụaka hụrụ ụmụ anụmanụ n’anya,” ka Tracy Reiman nke Ndị Na-ahụ Maka Imeso Anụmanụ Mmeso Ọma kwuru. “Mgbe ha malitere ịmata ihe na-eme ụmụ anụmanụ tupu e gbuo ha iji mere nri, nanị ihe ọ na-eme bụ imesi ọmịiko ha na-enwe ike.”

Ọtụtụ ndị na-enwe nchegbu banyere gburugburu ebe obibi na-emekwa ka e nwee njikọ dị n’agbata ihe oriri ha na oké mmefu a na-emefu ihe ndị sitere n’okike n’ịzụlite ụmụ anụmanụ iji mere nri. Dị ka ihe atụ, ọ na-ewe ihe dị ka lita 3,300 mmiri iji mepụta nanị otu kilogram anụ ehi na lita 3,100 maka otu kilogram ọ bụla nke anụ ọkụkọ. Nye ụfọdụ, nke a na-aghọzi ihe mere ha ji ezere anụ.

Gịnị banyere gị? Ì kwesịrị ịhapụ iri anụ? Tupu ị zaa ajụjụ ahụ, tụlee echiche ọzọ. Dị ka a na-ahụ n’Abụ Ọma 50:10, 11, Jehova Chineke, Onye Mere ihe nile, na-ekwu, sị: “Mụ nwe anụ ọhịa ọ bụla nke oké ọhịa, ya na anụ nile n’elu [otu puku] ugwu. Amawo m anụ ufe ọ bụla nke ugwu nile: anụ nile nke na-enugharị n’ọhịa dịkwa n’aka m.” Ebe ọ bụ na Chineke nwe anụmanụ nile n’ezie, ọ dị mkpa ịghọta ihe Onye Okike na-eche banyere ndụ anụmanụ na ojiji mmadụ ji ya eme ihe oriri.

Ọ̀ Dị Njọ Igbu Ụmụ Anụmanụ?

Ụfọdụ, dị ka Sujata, bụ́ ndị na-ewere ụmụ anụmanụ ịbụ ihe ha na mmadụ hà nhata na-eche n’ụzọ siri ike na igbu anụmanụ n’ihi nzube ọ bụla dị njọ—igbu ha iji mere nri kadị njọ. Ka o sina dị, Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Chineke na-akpa ókè n’etiti ndụ anụmanụ na ndụ mmadụ ma na-ekwe ka e gbuo ụmụ anụmanụ n’ihi ihe dị iche iche. Dị ka ihe atụ, n’Israel a pụrụ igbu anụmanụ mgbe ọ ghọrọ ihe iyi egwu nye ndụ mmadụ ma ọ bụ anụ ụlọ mmadụ.—Ọpụpụ 21:28, 29; 1 Samuel 17:34-36.

Site n’oge gboo, Chineke kwadoro ịchụ ụmụ anụmanụ dị ka àjà n’ofufe. (Jenesis 4:2-5; 8:20, 21) O nyekwara ụmụ Israel ntụziaka icheta Ọpụpụ ha site n’Ijipt site n’ime Ememe Ngabiga kwa afọ, nke gụnyere ịchụ nwa atụrụ ma ọ bụ ewu n’àjà na iri anụ ya. (Ọpụpụ 12:3-9) N’okpuru Iwu Mosis kwa, e nwere oge ndị ọzọ maka iji anụmanụ achụ àjà.

N’ịgụ Bible na nke mbụ ya, echiche nke ịchụ anụmanụ n’àjà amasịghị otu nwanyị Hindu dị afọ 70. Ma ka ọ na-aga n’ihu n’ihe ọmụma ya nke Akwụkwọ Nsọ, ọ pụrụ ịhụ na àjà ndị Chineke nyere iwu ka a chụọ nwere nzube. Ha tụrụ aka n’ihu n’àjà nke Jisọs Kraịst, nke ga-emezu ihe iwu chọrọ maka mgbaghara mmehie. (Ndị Hibru 8:3-5; 10:1-10; 1 Jọn 2:1, 2) N’ọtụtụ ọnọdụ àjà ndị ahụ na-abụkwa ihe oriri maka ndị nchụàjà na mgbe ụfọdụ maka ndị na-efe ofufe. (Levitikọs 7:11-21; 19:5-8) Chineke, bụ́ onye nwe ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ, pụrụ n’ụzọ ziri ezi iguzobe ndokwa dị otú ahụ maka otu nzube. N’ezie, ozugbo Jisọs nwụrụ, a chọkwaghị àjà ụmụ anụmanụ n’ofufe.—Ndị Kọlọsi 2:13-17; Ndị Hibru 10:1-12.

Iji Ụmụ Anụmanụ Eme Nri

Otú ọ dị, gịnị banyere igbu ụmụ anụmanụ iji mere nri? Ọ bụ eziokwu na ihe oriri mbụ nke mmadụ bụ nanị akwụkwọ nri. Ma Jehova mesịrị mesawanye ya ịgụnye anụ ụmụ anụmanụ. Ihe dị ka afọ 4,000 gara aga—n’oge nke Noa onye ezi omume—Jehova mere ka e nwee iju mmiri zuru ụwa ọnụ ma weta ajọ omume dị n’elu ụwa n’oge ahụ ná njedebe. Noa, ezinụlọ ya, na ihe ndị e kere eke dị ndụ o webara n’ụgbọ ahụ lanarịrị Iju Mmiri ahụ. Mgbe ha pụtasịrị n’ụgbọ ahụ, Jehova na nke mbụ ya kwuru, sị: “Ihe nile ọ bụla nke na-akpụ akpụ, nke dị ndụ, ga-abụrụ unu ihe oriri; dị ka akwụkwọ ihe ọkụkụ ka M nyeworo unu ha nile.” (Jenesis 9:3) Otú ọ dị, n’otu oge ahụ, Chineke nyere iwu, sị: “Onye na-awụsị ọbara mmadụ, site n’aka mmadụ ka a ga-awụsị ọbara ya: n’ihi na ọ bụ n’onyinyo Chineke ka O mere mmadụ.” (Jenesis 9:6) N’ụzọ doro anya, Chineke etinyeghị ụmụ anụmanụ na ụmụ mmadụ n’otu ọkwá.

N’ezie, nkweta Sujata banyere ụmụ anụmanụ dabeere ná nkwenkwe ya n’ozizi ịlọ ụwa. N’akụkụ a Bible na-akọwa na ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ bụ mkpụrụ obi, mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. (Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4, 20; Ọrụ 3:23; Mkpughe 16:3) Dị ka mkpụrụ obi, ma ụmụ mmadụ ma ụmụ anụmanụ na-anwụ ma kwụsị ịdị ndụ. (Eklisiastis 3:19, 20) Otú ọ dị, ụmụ mmadụ nwere olileanya magburu onwe ya nke mbilite n’ọnwụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.b (Luk 23:43; Ọrụ 24:15) Nke a kwa na-egosi na ụmụ anụmanụ na mmadụ ahaghị nhata.

“N’agbanyeghị nke ahụ, gịnị kpatara mgbanwe n’ihe oriri?” ka Sujata chọrọ ịma. Ihe àmà na-egosi na ihu igwe nke ụwa enwewo oké mgbanwe n’ihi Iju Mmiri ahụ. Ma Jehova ò webatara mgbakwụnye nke anụ n’ihe oriri mmadụ n’ihi na ọ tụrụ anya mkpa nke ọgbọ ndị na-abịa n’ihu ndị na-ebi n’ógbè ebe ihe ọkụkụ ga-adị ụkọ, Bible ekwughị. Ma Sujata pụrụ ịnakwere na Onye Nwe ihe nile dị ndụ nwere ike iwebata mgbanwe.

Igosi Nkwanye Ùgwù Maka Ndụ Anụmanụ

Ma, Sujata chere, sị, ‘Ma ọ dịghị ihe ọzọ ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị igositụ nkwanye ùgwù maka ndụ anụmanụ?’ Ee, anyị kwesịrị. Onye Okike nke ihe nile agwawokwa anyị ụzọ anyị nwere ike isi mee nke a. “Nanị anụ ahụ nke ndụ ya, bụ́ ọbara ya, dị n’ime ya ka unu na-agaghị eri,” ka iwu ya na-ekwu na Jenesis 9:4. Gịnị kpatara ihe mgbochi n’iri ọbara? “N’ihi na ndụ nke anụ ahụ, n’ọbara ka ọ dị,” ka Bible na-ekwu. (Levitikọs 17:10, 11) Jehova ekwuwo, sị: ‘Ị ga-awụsị ọbara nke anụ e gburu egbu n’ala dị ka mmiri.’—Deuterọnọmi 12:16, 24.

Nke a apụtaghị na ndokwa nke iri anụ bụ ikike imikpu n’ịwụsị ọbara nke anụmanụ n’ụzọ na-adịghị mkpa nanị n’ihi mkpali nke ịchụ nta ma ọ bụ iji gosipụta ike onwe onye. Ihe àmà gosiri na Nimrọd mere nke a. Bible na-akọwa ya dị ka ‘dike n’ịchụ nta [megide, NW] Jehova.’ (Jenesis 10:9) Ọbụna taa, mkpali n’ihe banyere ịchụ nta na igbu ụmụ anụmanụ pụrụ ịmalite n’ime ụfọdụ n’ụzọ dị mfe. Ma mmụọ dị otú ahụ na oké ejighị ndụ anụmanụ kpọrọ ihe na-aga ụkwụ na ụkwụ, Chineke adịghịkwa akwado ya.c

Inwe Ọmịiko n’Ebe Ụmụ Anụmanụ Nọ

Ụfọdụ ndị na-eri nanị akwụkwọ nri taa nwekwara nchegbu sitere n’ezi obi banyere mmeso ndị na-egbu anụ nke oge a na-emeso ụmụ anụmanụ. “Azụmahịa metụtara ọrụ ugbo nwere mmasị dị nta n’amamihe ebumpụta ụwa nke ụmụ anụmanụ,” ka The Vegetarian Handbook na-ekwu. “N’ịbụ ndị a zụlitere n’ụlọ ndị e mechiri emechi n’ụzọ jọgburu onwe ha na na gburugburu ebe obibi na-abụghị ebe e meere ha ibi,” ka akwụkwọ ahụ na-ekwu, “a na-eji ụmụ anụmanụ nke oge a eme ihe karịa ka e jitụrụla ha mbụ.”

Ọ bụ ezie na iji ụmụ anụmanụ mere nri emegideghị uche Chineke, mmeso obi ọjọọ a na-emeso ha na-emegide ya. “Onye ezi omume maara ndụ anụ ụlọ ya,” ka Bible na-ekwu n’Ilu 12:10. Iwu Mosis nyekwara iwu ka e lekọta anụ ụlọ n’ụzọ kwesịrị ekwesị.—Ọpụpụ 23:4, 5; Deuterọnọmi 22:10; 25:4.

Onye Kraịst Ò Kwesịrị Ịbụ Onye Na-eri Nanị Akwụkwọ Nri

Dị ka ihe e bu ụzọ kwuo na-egosi, okwu banyere ịghọ onye na-eri nanị akwụkwọ nri—ma ọ bụ ịnọgide bụrụ otu—bụ kpọmkwem okwu dịịrị mkpebi onwe onye. N’ihi ahụ ike, ọnọdụ akụ̀ na ụba, njikọ dị n’agbata ihe ndị dị ndụ na gburugburu ebe obibi ha, ma ọ bụ ọmịiko maka ụmụ anụmanụ, mmadụ pụrụ ịhọrọ ịgbaso usoro onye na-eri nanị akwụkwọ nri. Ma ọ ghaghị ịghọta ya dị ka nanị otu ụzọ iri ihe. O kwesịghị ịkatọ ndị họọrọ iri anụ, dị nnọọ ka onye na-eri anụ na-ekwesịghị ịkatọ onye na-eri nanị akwụkwọ nri. Iri anụ ma ọ bụ erighị ya adịghị eme mmadụ onye ka mma. (Ndị Rom 14:1-17) Ihe oriri mmadụ ekwesịghịkwa ịbụ nchegbu bụ isi ná ndụ ya. “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ,” ka Jisọs kwuru, “kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.”—Matiu 4:4.

N’ihe banyere mmeso obi ọjọọ nye ụmụ anụmanụ na iji ihe ndị a na-enweta n’ụwa eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, Jehova ekwewo nkwa iweta usoro ihe a nke rụrụ arụ na nke anyaukwu ná njedebe na iji ụwa ọhụrụ nke ọ na-eme dochie anya ya. (Abụ Ọma 37:10, 11; Matiu 6:9, 10; 2 Pita 3:13) N’ụwa ọhụrụ ahụ, mmadụ na ụmụ anụmanụ ga-anọkọ n’udo ruo mgbe ebighị ebi, Jehova ‘ga-ejikwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’—Abụ Ọma 145:16; Aịsaịa 65:25.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Teta! nke July 8, 1997, peji nke 3-13.

b Lee Ụlọ Nche nke May 15, 1997, peji nke 3-8.

c Lee Ụlọ Nche nke May 15, 1990, peji nke 30-31, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania bipụtara.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]

Punch

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya