“Ha Nwere Oké Obi Ụtọ Ka Ụmụaka”
Nke ahụ bụ otú Sergei dị afọ 32, bụ́ nna nke ụmụ atọ, siri kọwaa mmeghachi omume nke ndị enyi ya mgbe o gosiri ha akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? Sergei, onye bi na Tatarstan, Russia, na-akọwa ihe merenụ:
“Iji malite, anyị lere ihe osise ndị dị na ya ma gụọ okwu nkọwa ha. Nkwurịta okwu ndị na-adọrọ uche sochiri. Ndị enyi m nile bụ ndị nne na ndị nna na-akatabeghị ahụ . . . Anyị dum na-aga chọọchị n’Ista nakwa maka baptism, ma n’ebe ahụ ka mmasị anyị jedebere.
“N’aka nke ọzọ, lee ụdị mmasị anyị nwere n’akwụkwọ unu! Ihu akwụkwọ ahụ tụrụ àgwà mara mma, nke e jiri nkà chọọ mma na-adọrọ uche ngwa ngwa. Ị malite ịgụ ya, ọ na-esi ike ịkwụsị. Ị ga-achọ isoro ndị agbata obi kerịta ihe ị mụtaworo. Ọzọkwa, ị na-enwe obi ụtọ na afọ ojuju mgbe ị gụsịrị ma nwesịa nkwurịta okwu n’ihe ọmụma ahụ. N’ikpeazụ, anyị achọtawo ihe na-enye obi ụtọ nke ezi uche dị na ya, na nke bara uru ikwurịta.
“N’ezie, anyị na-ebi ndụ tọgbọ chakoo n’ụzọ ime mmụọ. Onye ọ bụla na-ekwu banyere ego, nsogbu, nchegbu, na atụmatụ nzuzo. Ihe ndị a bụ nanị obi ka ha na-etisasị. Mgbe i chesịrị echiche banyere ha, ị pụghị ịmalite ihi ụra ozugbo, n’ụtụtụ kwa ị gaghị achọ iteta ma mikpuo n’ikpó nsogbu nke ụmụ mmadụ.”
Ma eleghị anya i nwere mmetụta yiri ndị ahụ, ị ga-enwekwa obi ụtọ inweta otu n’ime mbipụta a na-adọrọ mmasị, nke Ndịàmà Jehova na-ebipụta, nzukọ mba nile nke ihe karịrị nde ndị mmụta Bible ise. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma banyere otú ị ga-esi nweta otu ma ọ bụ inwe ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5.